Nchegbu
Ị̀ na-echegbu onwe gị maka na ị bụ ogbenye, maka na agụụ na-anyụ gị ịkpakwụ, ma ọ bụ maka na i nweghị ebe obibi?
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
Ákwá 3:19—Jeremaya onye amụma na ọtụtụ ndị Juu ndị ọzọ enweghịzi ebe obibi mgbe e bibichara Jeruselem
2 Kọr. 8:1, 2; 11:27—O nwere oge Ndị Kraịst nọ na Masedonia na-ahụghị tụrụ rachaa. O nwekwara mgbe Pọl onyeozi na-anaghị enwe nri, ákwà, na ebe obibi
Amaokwu Baịbụl ndị na-akasi obi:
I nwekwara ike ịgụ Diut. 24:19
Ị̀ na-echegbu onwe gị maka na i nweghị enyi, ị nọ naanị gị, ma ọ bụkwanụ na i chere na e nweghị onye hụrụ gị n’anya?
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
1 Eze 18:22; 19:9, 10—Ịlaịja onye amụma chere na ọ bụ naanị ya fọdụrụ ná ndị na-efe Jehova ezigbo ofufe
Jere. 15:16-21—Owu nọ na-ama Jeremaya onye amụma maka na ndị ọ na-ezi ozi anaghị ege ya ntị, kama ihe bụ́ mkpa ha bụ oriri na ọṅụṅụ
Amaokwu Baịbụl ndị na-akasi obi:
Ihe e kwuru na Baịbụl nke na-akasi obi:
1 Eze 19:1-19—Jehova nyeere Ịlaịja onye amụma aka, gee ya ntị nke ọma ka ọ na-ekwu ihe na-echegbu ya. O mekwara ka obi sie Ịlaịja ike mgbe o chetaara ya ụdị ike ọ na-akpa
Jọn 16:32, 33—N’agbanyeghị na Jizọs ma na ndị na-eso ụzọ ya ga-ahapụ ya gbaa ọsọ, o doro ya anya na ọ nọghị naanị ya