Obi Ịjọ Mmadụ Njọ
Obi jọwa anyị njọ maka na ndị ọzọ gharịpụrụ anyị, kpasuo anyị iwe, ma ọ bụkwanụ mee ihe anyị na-atụghị anya ya
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
1 Sam. 8:1-6—Mgbe ndị Izrel siri ọnwụ ka Samuel họpụtara ha eze, o wutere ya, meekwa ka obi jọọ ya njọ
-
1 Sam. 20:30-34—Mgbe nna Jonatan, bụ́ Eze Sọl, ji iwe baara ya mba, obi jọrọ ya njọ, ya ewerekwa ya na nna ya menyere ya ihere
-
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
I nwekwara ike ịgụ Ilu 19:11; Fil. 4:8
-
Ihe e kwuru na Baịbụl nke na-akasi obi:
-
Ọma 55:12-14, 16-18, 22—Mgbe Ahitofel, bụ́ enyi Eze Devid, gharịpụrụ ya, ihe kasiri Devid obi bụ na ọ kọọrọ Jehova otú obi dị ya
-
2 Tim. 4:16-18—Ndị mmadụ gbahapụrụ Pọl onyeozi mgbe a nọ na-akpagbu ya, ma Jehova na olileanya Jehova mere ka o nwee nyeere ya aka ịdị ike
-
Obi jọwa anyị njọ maka ihe ndị anyị na-anaghị emetacha ma ọ bụ maka mmehie anyị mere
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Ọma 51:1-5—Obi jọrọ Eze Devid ezigbo njọ maka na o mehiere Jehova
-
Rom 7:19-24—Pọl onyeozi kwuru na ya ahụsiela anya n’ihi ọgụ na-anaghị akwụsị akwụsị ọ nọ na-alụ ka ọ ghara ime ihe ọjọọ ndị na-agụ ya agụụ
-
-
Amaokwu Baịbụl ndị na-akasi obi:
-
Ihe e kwuru na Baịbụl nke na-akasi obi:
-
1 Eze 9:2-5—N’agbanyeghị na Eze Devid mere mmehie ndị jọgburu onwe ha, Jehova weere ya ka onye ji obi ya niile jeere ya ozi
-
1 Tim. 1:12-16—N’agbanyeghị na Pọl onyeozi mere mmehie ndị jọrọ ezigbo njọ n’oge gara aga, obi siri ya ike na Chineke ga-emere ya ebere
-