Ọchịchị
Olee ọchịchị ezigbo Ndị Kraịst na-erubere isi ma na-akwado?
I nwekwara ike ịgụ Dan. 7:13, 14
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Ọma 89:18-29—E kwuru ihe ụfọdụ gbasara Eze Bụ́ Mezaya. Jehova mekwara ka ọ bụrụ eze kacha eze ndị ọzọ niile
-
Mkpu. 12:7-12—Ná mmalite oge ikpeazụ, Eze Bụ́ Mezaya malitere ịchị n’Alaeze Chineke. O sikwa n’eluigwe chụpụ Setan
-
Olee otú Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ n’ụwa si anọchite anya Alaeze Chineke?
Ndị Kraịst na-erubere ụmụ mmadụ na-achị achị isi
Gịnị mere anyị ji erube isi n’iwu obodo ma na-atụ ụtụ isi?
Rom 13:1-7; Taị. 3:1; 1 Pita 2:13, 14
I nwekwara ike ịgụ Ọrụ 25:8
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Mat. 22:15-22—Jizọs ji akọ zaa ajụjụ a jụrụ ya ma ndị na-eso ụzọ ya hà kwesịrị ịna-atụ ụtụ isi
-
Gịnị mere na anyị anaghị emegwara ndị mejọrọ anyị, ọ bụrụgodị na ha na-akpagbu anyị?
Gụọkwa isiokwu bụ́ “Mkpagbu”
Ndị Kraịst anaghị etinye aka n’ọchịchị ụwa a
Ọ bụ eziokwu na anyị na-akwanyere ndị ọchịchị ùgwù, gịnị mere anyị ji ajụ ime ihe ha kwuru ma ha chọọ ka anyị nupụrụ Chineke isi?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Dan. 3:1, 4-18—Ụmụ okorobịa atọ bụ́ Ndị Hibru jụrụ irube isi n’iwu ndị Babịlọn nyere maka na irube isi na ya ga-eme ka ha mebie iwu Chineke
-
Dan. 6:6-10—Mgbe Daniel onye amụma mere agadi, o kweghị erube isi n’iwu ndị ọchịchị nyere ka ọ ghara ikpe ekpere
-
Olee otú Jizọs si gosi na ndị na-eso ụzọ ya ekwesịghị itinye aka n’ọchịchị ụmụ mmadụ?
Olee otú iwu Chineke nyere anyị ka anyị ghara ikpere arụsị ga-esi nyere Onye Kraịst aka ka ọ ghara itinye aka n’ọchịchị ụwa a?
Olee amaokwu Baịbụl ndị nwere ike inyere Ndị Kraịst aka ịma ihe ha ga-eme ma ndị ọchịchị gwa ha ka ha soro lụọ agha?
I nwekwara ike ịgụ Ọma 11:5
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Mat. 26:50-52—Jizọs mere ka o doo anya na ndị na-eso ụzọ ya agaghị na-eso alụ agha
-
Jọn 13:34, 35—Onye Kraịst nwere ike ịjụ onwe ya, sị, ‘Olee otú o si bụrụ na m na-erube isi n’iwu a Jizọs nyere ma ọ bụrụ na m na-eburu ngwá agha gaa lụso ndị nọ na mba ọzọ agha ma ọ bụ gbuo ha, ndị nwere ike ịbụdị ụmụnna m?’
-
Gịnị mere na Ndị Kraịst anaghị eso ndị ji ngagharị iwe egosi na ihe ndị ọchịchị na-eme adịghị ha mma?
Gịnị mere na o kwesịghị ịtụ anyị n’anya na a na-ebo anyị ebubo na anyị na-agba ọchịchị mgba okpuru ma ọ bụkwanụ na-eme ka ọgba aghara dị n’obodo?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Ọrụ 16:19-23—Pọl onyeozi na Saịlas tara ahụhụ n’ihi na ha na-ekwusa ozi ọma
-