Ihe ị mụtara ọ̀ tọrọ gị ụtọ?
Ị̀ ga-achọ ịmụtakwu ihe na Baịbụl?
E wezụga ihe ndị a ị mụtara, e nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ ị ga-amụta n’akwụkwọ bụ́ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ịmụ Baịbụl Otú Ị Ga-aghọta Ya.
Anyị agaghị ana gị ego maka akwụkwọ ahụ. Anyị agaghịkwa ana gị ego maka anyị na gị ịmụ ya. Obi ga-adị anyị ụtọ ma anyị na gị na-amụ ya n’oge dị gị mma nakwa n’ebe ọ bụla ị chọrọ.
E nwere ọtụtụ ihe ị ga-amụta na Baịbụl ka anyị na gị na-amụ akwụkwọ ahụ. Ụfọdụ n’ime ha bụ:
Ihe mere anyị ji dịrị ndụ
Otú anyị ga-esi na-enwe ezigbo udo
Otú ezinụlọ ga-esi na-enwe obi ụtọ
Nkwa dị iche iche Baịbụl kwere gbasara ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu