Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 131

Eze Aka Ya Dị Ọcha Anọrọ n’Elu Osisi Na-ahụsi Anya

Eze Aka Ya Dị Ọcha Anọrọ n’Elu Osisi Na-ahụsi Anya

MATIU 27:33-44 MAK 15:22-32 LUK 23:32-43 JỌN 19:17-24

  • A KPỌGIDERE JIZỌS N’OSISI ỊTA AHỤHỤ

  • NDỊ AGHA EJIRI IHE E DERE N’ELU ISI JIZỌS KWAA YA EMO

  • JIZỌS EKWEE MMADỤ NKWA ỊNỌ NA PARADAỊS

A kpọọrọ Jizọs na mmadụ abụọ na-apụnara mmadụ ihe gaa n’ebe a ga-akpọgide ha n’osisi. Ebe ahụ adịghị anya na Jeruselem. A na-akpọ ya Gọlgọta ma ọ bụ Ebe Okpokoro Isi. Mmadụ nwere ike ịnọ ebe “dịtụ anya” na Jeruselem na-ahụ ebe ahụ.—Mak 15:40.

E yipụrụ Jizọs na mmadụ abụọ ọzọ a mara ha na ya ikpe ọnwụ uwe ha. E wetaara ha mmanya e tinyere mea na ihe na-elu ilu ka ha ṅụọ. Ọ ga-abụ ụmụ nwaanyị Jeruselem tinyere mea ná mmanya ahụ. Ndị Rom na-ekwe ka e nye onye a chọrọ igbu egbu mmanya a n’ihi na ọ na-eme ka ihe a na-eme ya ghara ịfụcha ya ụfụ. Mgbe Jizọs detụrụ mmanya ahụ ire, ọ jụrụ ịṅụ ya. N’ihi gịnị? Ọ chọghị ihe ga-eme ka ọ ghara ịma onwe ya n’oge a ọ nọ ná nnukwu nsogbu. Ọ chọkwara ikwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ.

Ndị agha gbatịrị Jizọs n’elu osisi ma kụbanye ntú n’aka ya na n’ụkwụ ya. (Mak 15:25) Ntú ndị ahụ mapuru anụ ahụ́ ya na akwara ya. Nke a fụrụ Jizọs ezigbo ụfụ. Ka a na-akwụwa osisi ahụ ọtọ, ọ fụkwuru ya ụfụ, n’ihi na ahụ́ ya dum nyịgidere ebe ahụ a kụnyere ya ntú n’ụkwụ na n’aka, mee ka ahụ́ ya na-adọwakwu. N’agbanyeghị ihe ndị a, Jizọs abaraghị ndị agha ahụ mba. O kpegaara Chineke ekpere, sị: “Nna, gbaghara ha, n’ihi na ha amaghị ihe ha na-eme.”—Luk 23:34.

Ndị Rom na-edekarị ihe onye ha chọrọ igbu mere ma kụnye ya n’osisi a kpọgidere ya. Mana ihe Paịlet dere kụgide n’osisi a kpọgidere Jizọs bụ: “Jizọs onye Nazaret, Eze ndị Juu.” E dere ya n’asụsụ Hibru, Latịn, na Grik ka ọtụtụ ndị nwee ike ịgụ ya. Ihe ahụ Paịlet dere gosiri na obi adịghị ya mma n’ebe ndị Juu nọ, bụ́ ndị siri ọnwụ ka e gbuo Jizọs. Ndị isi nchụàjà iwe ji gbara ihe ahụ Paịlet dere ụkwụ. Ha gwara ya, sị: “Edela ‘Eze ndị Juu,’ kama dee na ọ sịrị, ‘Abụ m Eze ndị Juu.’” Ma, Paịlet achọghị ka ha jiri ya kwara ngwá ọrụ otú ha mere na mbụ. N’ihi ya, ọ sịrị: “Ihe m dere, edewo m ya.”—Jọn 19:19-22.

Ndị isi nchụàjà ahụ iwe ji kwughachiri ebubo ahụ e boro Jizọs mgbe ahụ ndị Sanhedrin na-ekpe ya ikpe. Ọ bụ ya mere ndị na-agafe agafe ji na-efufe isi ha ma na-akwa ya emo, sị: “Tụfịa! Gị onye ga-akwatu ụlọ nsọ, onye ga-ewukwa ya n’ụbọchị atọ, zọpụta onwe gị site n’isi n’osisi ịta ahụhụ ahụ rịdata.” Ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ gwakwara ibe ha, sị: “Ka Kraịst bụ́ Eze Izrel si n’osisi ịta ahụhụ rịdata ugbu a, ka anyị wee hụ ma kwere.” (Mak 15:29-32) Ndị ohi abụọ ahụ a kpọgidere ha na Jizọs n’osisi, otu n’aka nri ya, nke ọzọ n’aka ekpe ya kwadịrị ya emo, ọ bụ eziokwu na e nweghị ihe Jizọs mere.

Ndị agha Rom anọ jikwa Jizọs mee ihe ọchị. O nwere ike ịbụ na ha nọ na-aṅụ mmanya gbara ụka kemgbe. Ugbu a, ha weliri iko mmanya ha n’ihu Jizọs n’agbanyeghị na ha ma na e nweghị otú Jizọs ga-esi matịa aka nara ha ya. Ndị agha Rom ahụ ji ihe ahụ Paịlet dere gbasara Jizọs kwaa ya emo. Ha sịrị ya: “Ọ bụrụ na ị bụ eze ndị Juu, zọpụta onwe gị.” (Luk 23:36, 37) Leenụ, onye a bụ́ ụzọ, eziokwu, na ndụ, ka a na-akparị ma jiri na-eme ihe ọchị. Ma, o diri ihe niile ahụ. Ọ kparịghị ndị Juu na-ele ya anya, ma ọ bụ ndị agha Rom ji ya eme ihe ọchị. Ọ kparịghịkwa ndị omekome abụọ ahụ a kpọgidere ha na ya n’osisi.

Ndị agha Rom anọ ahụ weere uwe elu Jizọs kee ya ụzọ anọ. Ha fere nza ka ha mara onye ga-ewere nke ọ ga-ewere. Ma, uwe ime Jizọs ka uwe elu ya mma. Uwe ime a “enweghị ebe a dụkọtara ya n’ihi na a kpara ya akpa site n’elu gbadaa.” N’ihi ya, ndị agha ahụ gwarịtara ibe ha, sị: “Ka anyị ghara ịdọwa ya adọwa, kama ka anyị kpebie site n’ife nza onye ọ ga-abụ nke ya.” Ha si otú a mezuo ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ, nke sịrị: “Ha kere uwe elu m n’etiti onwe ha, ha fekwara nza maka uwe m.”—Jọn 19:23, 24; Abụ Ọma 22:18.

Obere oge, otu n’ime ndị omekome ahụ ghọtara na Jizọs bụ eze n’eziokwu. Ọ baara onye nke ọzọ mba, sị: “Ị́ dịghị atụ egwu Chineke, ugbu a a mara gị otu ikpe ahụ a mara ya? Nke anyị zikwara nnọọ ezi, n’ihi na anyị na-anatazu ihe kwesịrị anyị maka ihe ndị anyị mere; ma ọ dịghị ihe na-ekwesịghị ekwesị nwoke a mere.” Ọ rịọziri Jizọs, sị: “Cheta m mgbe ị banyere n’alaeze gị.”—Luk 23:40-42.

Jizọs gwara ya, sị: “N’ezie, ana m asị gị taa, Mụ na gị ga-anọ,” ọ bụghị n’Alaeze eluigwe, kama “na Paradaịs.” (Luk 23:43) Nkwa a Jizọs kwere nwoke a dị iche na nke o kwere ndịozi ya. O kwere ha nkwa na ya na ha ga-anọ n’ocheeze n’Alaeze eluigwe. (Matiu 19:28; Luk 22:29, 30) O nwere ike ịbụ na onye omekome ahụ bụ́ onye Juu anụla banyere Paradaịs ahụ dị n’ụwa, bụ́ ebe Jehova tinyere Adam na Iv, nke ọ chọkwara ka ha na ụmụ ha biri na ya. Ka onye omekome ahụ na-anwụ, o bu n’obi na ya ga-ebi na Paradaịs n’ọdịnihu.