Samuel nke Mbụ 17:1-58

  • Devid meriri Golayat (1-58)

    • Golayat na-echere ndị Izrel aka mgba (8-10)

    • Devid kwuru na ya ga-alụso Golayat agha (32-37)

    • Devid ji aha Jehova lụso Golayat agha (45-47)

17  Ndị Filistia+ wee kpọkọta ndị agha ha maka agha. Ha zukọtara na Soko,+ nke dị na Juda, maa ụlọikwuu ha n’Ifes-damim,+ n’agbata Soko na Azika.+  Ma, Sọl na ndị Izrel zukọtara maa ụlọikwuu ha na Ndagwurugwu Ịla.+ Ha hazikwara onwe ha n’usoro ka ha lụso ndị Filistia agha.  Ndị Filistia nọ n’ugwu dị n’otu akụkụ, ndị Izrel anọrọ n’ugwu dị n’akụkụ nke ọzọ, ndagwurugwu adịrị n’etiti ha.  Otu dike n’agha wee si n’ebe ndị Filistia mara ụlọikwuu pụta. Aha ya bụ Golayat.+ Ọ bụ onye Gat.+ Ọ dị kubit isii na otu ntụ ọbụ aka n’ogologo.*  O kpukwa okpu agha e ji ọla kọpa mee, yirikwa uwe agha nke nwere ihe dị ka akpịrịkpa azụ̀ ndị dị n’elu ibe ha. Uwe agha ya ahụ e ji ọla kọpa mee+ dịkwa puku shekel ise (5,000) n’arọ.*  O yi ihe e ji ekpuchi ụkwụ n’ụkwụ ya. E jikwa ọla kọpa mee ya. Árọ̀+ e ji ọla kọpa kpụọ dịkwa n’azụ ya, n’agbata ubu ya abụọ.  Okporo osisi ube ya dị ka nke ndị na-ekwe ákwà.+ Ọnụ ube ya e ji ígwè kpụọ dị narị shekel isii (600) n’arọ.* Onye na-eburu ya ọta nọkwa na-aga ya n’ihu.  O wee kwụrụ, na-eti mkpu, na-asị ndị agha Izrel:+ “Gịnị mere unu ji pụta hazie onwe unu n’usoro ịlụ agha? Mụnwa apụtala ịlụrụ ndị Filistia agha. Ununwa na-ejere Sọl ozi. Họpụtanụ otu nwoke ka ọ bịa lụso m ọgụ.  Ọ bụrụ na ọ lụso m ọgụ ma gbuo m, anyị ga-aghọ ndị ohu unu. Ma, ọ bụrụ na mụnwa emerie ya ma gbuo ya, unu ga-aghọ ndị ohu anyị.” 10  Onye Filistia ahụ sịkwara: “M na-echere ndị agha Izrel aka mgba+ taa.* Họpụtanụ otu nwoke ka mụ na ya chịpụ ya!” 11  Mgbe Sọl na ndị Izrel niile nụrụ ihe ndị a onye Filistia ahụ kwuru, ezigbo ụjọ jidere ha. 12  Ma Devid bụ nwa Jesi,+ onye Efrata,+ ya bụ, onye Betlehem+ nke dị na Juda. Jesi mụrụ ụmụ nwoke asatọ.+ O meekwala agadi n’oge Sọl na-achị. 13  Ụmụ nwoke atọ mbụ Jesi mụtara so Sọl gaa agha.+ Aha nke ọkpara bụ Elayab.+ Nke abụọ bụ Abinadab,+ nke atọ bụ Shama.+ 14  Devid bụ ọdụdụ nwa.+ Ụmụnne ya atọ ahụ, ndị so Sọl, bụ ụmụ nwoke ndị mbụ nna ya mụrụ. 15  Devid na-esi na nke Sọl na-aga Betlehem elekọta atụrụ nna ya.+ Ya gaa, ya alọtakwa. 16  Ma, onye Filistia ahụ na-apụta, chee ndị Izrel ihu n’ụtụtụ ọ bụla nakwa n’uhuruchi ọ bụla ruo ụbọchị iri anọ. 17  Otu ụbọchị, Jesi sịrị Devid nwa ya: “Biko, buru ọka* a e ghere eghe,* nke dị otu efa,* nakwa achịcha iri a bugara ụmụnne gị ngwa ngwa n’ebe ndị agha Izrel mara ụlọikwuu. 18  Burukwa chiiz* a dị ụzọ iri bugara ọchịagha otu puku ndị agha. Gaakwa hụ ụmụnne gị ka ị mara otú ha mere. Natakwa ha ihe ga-egosi m na ahụ́ dị ha.” 19  N’oge ahụ, ha na Sọl na ndị Izrel ndị ọzọ nọ na Ndagwurugwu Ịla,+ ka ha lụso ndị Filistia agha.+ 20  Devid wee bilie n’isi ụtụtụ hapụ ìgwè atụrụ ahụ n’aka onye na-elekọta atụrụ, buru ihe ndị ahụ gawa ebe ahụ Jesi nna ya gwara ya gaa. Mgbe ọ garuru ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu, ndị agha nọ na-aga n’ọgbọ agha, na-eti mkpu agha. 21  Ndị Izrel na ndị Filistia wee malite ịhazi ndị agha ha ka ha lụso ibe ha agha. 22  Ozugbo ahụ, Devid hapụrụ ibu ya n’aka onye na-elekọta ibu, gbara gawa n’ọgbọ agha. Mgbe o ruru, ọ malitere ịjụ otú ụmụnne ya mere.+ 23  Ka ọ nọ na-ajụ ihe a, dike ahụ aha ya bụ Golayat,+ onye Filistia nke si Gat, pụtara. O si n’ebe ndị agha ndị Filistia nọ pụta. O kwuru ihe ndị ahụ o kwuru na mbụ,+ Devid anụ ya. 24  Mgbe ndị Izrel niile hụrụ nwoke ahụ, ezigbo ụjọ jidere ha, ha agbaa ọsọ.+ 25  Ndị Izrel nọkwa na-asị: “Ùnu hụrụ nwoke a? Ọ na-echere ndị Izrel aka mgba.*+ Onye ọ bụla gburu ya, eze ga-eme ya ọgaranya, kpọnye ya nwa ya nwaanyị,+ ndị ezinụlọ nna ya agaghịkwa na-enye eze ihe ọ bụla ndị Izrel kwesịrị ịna-enye eze.” 26  Devid wee jụwa ndị guzo ya nso, sị: “Gịnị ka a ga-emere onye gburu onye Filistia a ma si otú ahụ mee ka a kwụsị mkparị a a na-akparị ndị Izrel? Ònyekwanụ bụ onye Filistia a a na-ebighị úgwù nke na ọ ga na-echere ndị agha Chineke dị ndụ aka mgba?”*+ 27  Ha wee gwa ya otu ihe ahụ e kwuru na mbụ, sịkwa ya: “Ihe a ka a ga-emere onye gburu ya.” 28  Mgbe Elayab bụ́ ọkpara+ nne ya nụrụ ka ọ na-agwa ndị ahụ okwu, o wesara ya iwe, sị ya: “Ị̀ bịara gịnị ebe a? Ònye ka ị hapụụrụ atụrụ ole na ole ahụ n’ala ịkpa?+ Ama m na ị na-achọkarị ime ihe a na-enyeghị gị ikike ime, nakwa na ihe juru gị n’obi bụ ihe ọjọọ. Amakwa m na ihe mere i ji bịa bụ ka ị hụ otú agha a si aga.” 29  Devid asị ya: “Gịnị ka m mekwara ugbu a? Ọ̀ kwa naanị ajụjụ ka m jụrụ?” 30  Devid tụgharịkwara chee onye ọzọ ihu ma jụọ otu ihe ahụ ọ jụburu,+ ndị mmadụ azaakwa ya otu ihe ahụ a zaburu ya.+ 31  Ndị nụrụ ihe ahụ Devid jụrụ gara kọọrọ ya Sọl, ya asị ka a kpọta ya. 32  Devid asị Sọl: “Ka obi ghara ịwụba onye ọ bụla n’afọ n’ihi onye Filistia a. Mụnwa bụ́ ohu gị ga-aga lụso ya ọgụ.”+ 33  Ma Sọl sịrị Devid: “Ị gaghị alụsoli onye Filistia a ọgụ, n’ihi na ị ka bụ nwata,+ ma yanwa si na nwata lụwa agha.” 34  Devid asị Sọl: “Mụnwa bụ́ ohu gị nọ na-azụ atụrụ nna m, otu ọdụm+ abịa buru otu atụrụ n’atụrụ ndị ahụ. N’oge ọzọkwa, otu anụ ọhịa bea bịakwara mee otu ihe ahụ. 35  Ma, m chụwara ha kụgbuo ha ma napụta atụrụ ndị ahụ n’ọnụ ha. Mgbe ha lụsoro m ọgụ, m jidere ha n’ajị* kụgbuo ha. 36  Ohu gị kụgburu ma ọdụm ahụ ma anụ ọhịa bea ahụ. Onye Filistia a a na-ebighị úgwù ga-adịkwa ka otu n’ime ha, n’ihi na ọ na-echere ndị agha Chineke dị ndụ aka mgba.”*+ 37  Devid kwukwara, sị: “Ọ bụ Jehova, onye napụtara m n’aka ọdụm nakwa n’aka anụ ọhịa bea, ga-anapụtakwa m n’aka onye Filistia a.”+ Sọl asị Devid: “Gawa, ka Jehova nọnyere gị.” 38  Sọl wee chịrị ekike agha ya kee Devid. O kpuwekwara ya okpu agha e ji ọla kọpa mee, yiwezie ya uwe agha. 39  Devid wee kegide mma agha ya n’uwe ya, chọọkwa ịgawa, ma o kweghị ya, n’ihi na o ketụbeghị ekike agha mbụ. Ọ gwaziri Sọl, sị: “Enweghị m ike iyi ihe ndị a gaa, n’ihi na eyitụbeghị m ha.” Devid wee yipụ ha. 40  O wekwaara mkpara ya, gaa n’iyi dị na ndagwurugwu, họrọ nkume ise na-akwọ mụrụmụrụ, chịnye ha n’akpa o ji azụ atụrụ. O jikwa èbè*+ ya n’aka, gakwuruwezie onye Filistia ahụ. 41  Onye Filistia ahụ wee na-abịa Devid nso n’ike n’ike. Nwoke na-eburu ya ọta nọkwa na-aga ya n’ihu. 42  Mgbe onye Filistia ahụ lere anya hụ Devid, o ledara ya anya n’ihi na ọ na-acha ọbara ọbara, bụrụkwa nwata. Ọ makwara mma nwoke.+ 43  Onye Filistia ahụ wee sị Devid: “M̀ bụ nkịta,+ mere i ji jiri mkpara na-abịa ịlụso m ọgụ?” Onye Filistia ahụ wee jiri aha chi ya bụọ Devid ọnụ. 44  Ọ sịkwara Devid: “Bịa ebe a ka m kesaara ụmụ nnụnụ na anụ ọhịa anụ gị.” 45  Devid wee gwa onye Filistia ahụ, sị: “I ji mma agha na ube na árọ̀+ na-abịa ịlụso m ọgụ, ma m ji aha Jehova nke ụsụụ ndị agha,+ bụ́ Chineke ndị agha Izrel, onye ị na-akparị,* na-abịa ịlụso gị ọgụ.+ 46  Jehova ga-enyefe gị n’aka m taa.+ M ga-egbu gị, gbupụkwa gị isi. Ọ bụkwa taa ka m ga-enye ụmụ nnụnụ na anụ ọhịa ozu ndị agha Filistia. Ndị niile bi n’ụwa ga-amakwa na Chi ndị Izrel bụ ezi Chineke.+ 47  Ndị niile gbakọrọ ebe a ga-amakwa na Jehova nwere ike ịzọpụta anyị n’ejighị mma agha ma ọ bụ ube,+ n’ihi na ọ bụ Jehova nwe agha a.+ Ọ ga-enyefekwa unu n’aka anyị.”+ 48  Onye Filistia ahụ wee na-abịakwu Devid nso, Devid emee ngwa ngwa gbara gawa n’ọgbọ agha ebe onye Filistia ahụ nọ. 49  Devid tinyekwara aka n’akpa ya, wepụta otu nkume, gbapụ ya. Ọ gbara ya onye Filistia ahụ n’egedege ihu, nkume ahụ abamie n’egedege ihu ya, ya adaa kpuo ihu n’ala.+ 50  Otú a ka Devid si jiri èbè* na nkume merie onye Filistia ahụ. N’agbanyeghị na o jighị mma agha ọ bụla, ọ gbaturu onye Filistia ahụ, gbuokwa ya.+ 51  Devid wee gbara ọsọ gaa guzoro n’akụkụ onye Filistia ahụ. O wekwaara mma agha onye Filistia ahụ,+ mịpụta ya n’ọbọ ya ma gbupụ ya isi iji jide n’aka na ọ nwụọla. Ndị Filistia gbara ọsọ mgbe ha hụrụ na dike ha anwụọla.+ 52  Ndị Izrel na ndị Juda wee tiwe mkpu ọṅụ, sikwa na ndagwurugwu ahụ+ chụrụ ndị Filistia ruo n’ọnụ ụzọ ámá Ekrọn.+ Ndị Filistia e gburu egbu tọgbọcha n’ụzọ malite na Shearem+ ruo Gat na Ekrọn. 53  Mgbe ndị Izrel chụchara ndị Filistia ajọ ọsọ ma lọghachi, ha kwakọọrọ ihe ndị dị n’ebe ndị Filistia mara ụlọikwuu. 54  Devid bukwaara isi onye Filistia ahụ bute Jeruselem. Ma, ọ chịbara ngwá ọgụ onye Filistia ahụ n’ụlọikwuu nke ya.+ 55  Mgbe Sọl hụrụ ka Devid na-aga ịlụso onye Filistia ahụ agha, ọ jụrụ Abna,+ onyeisi ndị agha, sị: “Abna, nwa a ọ̀ bụ nwa onye?”+ Abna asị ya: “Eze, ịgwa gị eziokwu, amaghị m.” 56  Eze asị ya: “Chọpụta onye ọ bụ nwa ya.” 57  N’ihi ya, ozugbo Devid gbuchara onye Filistia ahụ lọta, Abna kpọọrọ ya bịakwute Sọl. Devid bukwa isi onye Filistia ahụ+ n’aka. 58  Sọl asị ya: “Nwa m, ị̀ bụ nwa onye?” Devid asị ya: “Abụ m nwa ohu gị bụ́ Jesi+ onye Betlehem.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọ dị ihe dị ka mita 2.9 n’ogologo (amaụkwụ 9 na inch 5.75). Gụọ B14.
Ihe dị ka kilogram 57. Gụọ B14.
Ihe dị ka kilogram 6.84. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “M na-akparị ndị agha Izrel taa.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Ma ọ bụ “ọka a ṅara n’ọkụ.”
Efa bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu efa bụ ihe dị ka lita 22. Gụọ B14.
Na Hibru, “mmiri ara ehi.”
Ma ọ bụ “Ọ na-akparị ndị Izrel.”
Ma ọ bụ “na-akparị ndị agha Chineke dị ndụ.”
Ma ọ bụ “n’agba.”
Ma ọ bụ “ọ na-akparị ndị agha Chineke dị ndụ.”
Èbè bụ ihe yiri katapọt.
Ma ọ bụ “ị na-ama aka.”
Èbè bụ ihe yiri katapọt.