Samuel nke Mbụ 18:1-30
18 Mgbe Jonatan+ nụrụ ihe Devid gwara Sọl, ọ bịara hụ Devid n’anya ka onwe* ya, ha abụọ abụrụ ezigbo enyi.+
2 Malite n’ụbọchị ahụ, Sọl kpọọrọ Devid ka ọ na-ejere ya ozi. O kweghịkwa ka ọ laghachi n’ụlọ nna ya.+
3 Ebe ọ bụkwa na Jonatan hụrụ Devid n’anya ka onwe* ya,+ ha abụọ gbara ndụ.+
4 Jonatan yipụkwara uwe na-enweghị aka o yi, chịnye ya Devid. Ọ chịnyekwara ya uwe agha ya, nyekwa ya mma agha ya, ụta ya, na ájị̀* ya.
5 Devid malitekwara ịna-aga agha. Ọ na-akpakwa ike*+ ebe ọ bụla Sọl zigara ya. N’ihi ya, Sọl họpụtara ya ka ọ bụrụ otu n’ime ndị ọchịagha ya.+ Ihe a masịkwara ndị Izrel niile na ndị na-ejere Sọl ozi.
6 Ọ na-abụ Devid na ndị agha ndị ọzọ gbuchaa ndị Filistia lọta, ụmụ nwaanyị esi n’obodo niile dị n’Izrel pụta, gụrụ egwú,+ kụrụ obere ịgbà,+ kpọrọ une, ṅụrụ ọṅụ, gbarakwa egwú gaa izute Eze Sọl.
7 Ihe a ka ụmụ nwaanyị ndị a na-enwe aṅụrị na-agụ n’egwú:
“Sọl egbuola puku kwuru puku,Devid egbuokwala iri puku kwuru iri puku.”+
8 Mgbe Sọl nụrụ egwú a,+ ọ dịghị ya mma. O wekwara ezigbo iwe, na-agwa onwe ya, sị: “Ha na-eto Devid na-asị na o gburu iri puku kwuru iri puku, ma na-eto m na-asị na m gburu puku kwuru puku. Naanị ihe fọziri bụ ime ya eze.”+
9 Malite ụbọchị ahụ gawa, Sọl lewere Devid anya ọjọọ.
10 N’echi ya, Chineke kwere ka mmụọ na-adịghị mma mee ka obi ghara izu Sọl ike,*+ ya ebido na-emegheri emegheri* n’ime ụlọ, ka Devid nọ na-akpọ ụbọ+ otú ọ na-eme n’oge ndị ọzọ. Sọl jikwa ube n’aka.+
11 Ọ tụkwara ube ahụ,+ na-agwa onwe ya, sị: “M ga-atụgide Devid n’ahụ́ ájá!” Ọ tụrụ ya ube ahụ ugboro abụọ, ma Devid zechara ha ma si ebe ọ nọ gbapụ.
12 Sọl wee malite ịtụ Devid egwu n’ihi na Jehova nọnyeere Devid+ ma hapụ yanwa.+
13 N’ihi ya, Sọl chụpụrụ ya ka ya na ya ghara ịna-anọ ma họpụta ya ka ọ bụrụ ọchịagha otu puku (1,000) ndị agha. Devid na-edukwa ndị agha a aga agha.*+
14 Ihe niile Devid na-eme nọkwa na-aga nke ọma.*+ Jehova nọnyekwaara ya.+
15 Mgbe Sọl hụrụ na ihe na-agaziri Devid, ọ tụwara ya egwu.
16 Ma, ndị Juda na ndị Izrel ndị ọzọ hụrụ Devid n’anya, n’ihi na ọ na-edu ha aga agha.
17 Sọl mechara sị Devid: “Ị̀ hụla ada m bụ́ Mirab?+ M ga-akpọnye gị ya ka ị lụwa.+ Ma, na-akata obi na-ejere m ozi otú i si eme, na-alụkwara Jehova agha.”+ Ma Sọl gwara onwe ya, sị: ‘Achọghị m igbu ya n’onwe m. Kama, ka ọ bụrụ ndị Filistia ga-egbu ya.’+
18 Ma, Devid sịrị Sọl: “Ònye ka m bụ, ole ndị ka ndị ikwu m na ezinụlọ nna m bụkwa n’Izrel, nke na m ga-abụ ọgọ eze?”+
19 Ma, tupu oge eruo ka a kpọnye Devid Mirab, bụ́ ada Sọl, a kpọnyela ya Edriel onye Ebel-mehola ka ọ lụwa.+
20 Ma, Maịkal,+ nwa Sọl, hụrụ Devid n’anya. A gwakwara ya Sọl, ya adị ya mma.
21 Sọl wee sị: “M ga-ekenye ya nwa m nwaanyị ka ọnyà m jide ya, ka aka ndị Filistia kpara ya.”+ Sọl gwaziri Devid ọzọ, sị: “Mụ na gị ga-agọ ọgọ taa.”
22 Sọl gwakwara ndị na-ejere ya ozi, sị: “Gwanụ Devid na nzuzo, sị, ‘Ihe gị dị eze mma, ndị niile na-ejere ya ozi hụkwara gị n’anya. Kweta ka gị na eze gọọ ọgọ.’”
23 Mgbe ndị na-ejere Sọl ozi gwara Devid ihe a, ọ gwara ha sị: “Ùnu chere na mụ na eze ịgọ ọgọ bụ obere ihe, ebe m bụ ogbenye, abụghịkwa m onye a ma ama?”+
24 Ndị na-ejere Sọl ozi wee gwa ya ihe Devid kwuru.
25 Sọl asị ha: “Gwanụ Devid sị, ‘Eze achọghị ka i nye ya ego isi nwaanyị.+ Naanị ihe ọ chọrọ bụ otu narị (100) apị́+ ndị Filistia, ka eze si otú ahụ megwara ndị iro ya ihe ha mere ya.’” Ma nkata Sọl nọ na-akpa bụ ka ndị Filistia gbuo Devid.
26 Ndị na-ejere ya ozi wee gwa Devid ihe ndị a, ya adị ya mma ka ya na eze gọọ ọgọ.+ Tupu oge e nyere Devid eruo,
27 ya na ndị agha ya gara gbuo narị ụmụ nwoke ndị Filistia abụọ. Devid wetakwaara eze apị́ niile ọ sịrị ya weta, ka ya na eze gọọ ọgọ. N’ihi ya, Sọl kpọnyere ya Maịkal nwa ya nwaanyị ka ọ lụwa.+
28 Sọl wee mata na Jehova nọnyeere Devid+ nakwa na Maịkal, nwa ya nwaanyị, hụrụ Devid n’anya.+
29 Ihe a mere ka Sọl na-atụkwu Devid egwu. Sọl wekwaara Devid ka onye iro ya ruo mgbe ọ nwụrụ.+
30 Ndị isi ndị Filistia na-apụtakwa ịlụ agha, ma mgbe ọ bụla ha pụtara ịlụ agha, Devid na-akpa ike* karịa ndị agha Sọl ndị ọzọ.+ Aha ya na-edekwa ude.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
^ Ya bụ, belt.
^ Ma ọ bụ “Ọ na-akpakwa àgwà onye ma ihe.”
^ Na Hibru, “mmụọ na-adịghị mma nke si n’ebe Chineke nọ kpawara ike n’ahụ́ Sọl.”
^ Ma ọ bụ “na-eme ka onye amụma.”
^ Na Hibru, “na-apụkwa ma na-abata n’ihu ndị Izrel.”
^ Ma ọ bụ “Devid nọkwa na-egosi na ọ ma ihe n’ihe niile ọ na-eme.”
^ Ma ọ bụ “na-akpa àgwà onye ma ihe.”