Aịzaya 57:1-21
57 Onye ezi omume alaala n’iyi,Ma, o nweghị onye ọ na-emetụ n’obi.
Ndị jisiri Chineke aka ike na-anwụ.+
Ma, o nweghị onye na-aghọta na ihe mere onye ezi omume ji nwụọBụ ka ọdachi ghara ịdakwasị ya.*
2 Ọ na-anọ n’udo.
Ndị niile na-anaghị ahapụ ụzọ ha kwesịrị iso na-ezuru ike n’ili.*
3 “Ma ununwa, bụ́ ụmụ nke nwaanyị na-akọ ọdịnihuNa ụmụ nke nwoke na-akwa iko na nwaanyị akwụna,Bịanụ nso:
4 Ònye ka unu ji eme ihe ọchị?
Ònye ka unu na-akwa emo? Ònyekwa ka unu na-akparị?
Ọ̀ bụ na unu abụghị ụmụ na-emebi iwuNa ụmụ na-aghọ aghụghọ,+
5 Ndị mmekọahụ na-agụsi ike n’ebe osisi ukwu dị iche iche dị,+Nakwa n’okpuru nnukwu osisi ọ bụla na-ama pokopoko,+Ndị na-egbu ụmụaka na ndagwurugwu dị iche iche,+N’ebe ndị gbawara agbawa ná nnukwu nkume?
6 Ị họọrọ nkume na-akwọ mụrụmụrụ ndị si na ndagwurugwu.
Ọ bụ ha bụ òkè gị.+
Ọ bụkwa ha ka ị na-achụrụ àjà mmanya, na-enyekwa onyinye.+
Ihe ndị a hà ga-eme ka obi dị mụ mma?*
7 I dowere àkwà* gị n’elu ugwu dị oké elu.+
Ị gakwara ịchụ àjà ebe ahụ.+
8 I dowere ihe a ga-eji na-echeta gị n’azụ ibo ụzọ nakwa n’awara ụzọ.
Ị hapụrụ m, gbara ọtọ.
Ị gara ebe ahụ mee ka àkwà* gị saa mbara.
Gị na ndị gị na ha na-eme enyi gbara ndụ.
Ọ na-atọgbukwa gị atọgbu ka gị na ha dinaa.+
Ị nọkwa na-ele ihe ha ji bụrụ nwoke.*
9 I ji mmanụ gakwuru Melek.*
I jikwa nnukwu sent gakwuru ya.
I zigakwara ndị ozi gị ebe dị anya,Si otú ahụ weda onwe gị ala ruo n’ili.*
10 Ọtụtụ ebe i tinyere isi emeela ka ị rụgbuo onwe gị n’ọrụ.
Ma, ị sịghị, ‘Ọ baghị uru ọ bụla!’
I nwetaghachiri ike.
Ọ bụ ya mere na ị naghị ada mbà.*
11 Ònye ka ụjọ ya bịara gị,Nke mere i ji malite ịgha ụgha?+
I chetaghị m.+
Ọ dịghị ihe i chebaara echiche.+
Ihe i ji ghara ịtụ m egwu bụ maka naM gbachiri nkịtị ma leghara ihe i mere anya.*+
12 M ga-akọsa ihe ị sị na ọ bụ ezi omume+ ị na-eme na ọrụ niile ị na-arụ.+
Ha agaghịkwa abara gị uru.+
13 I tie mkpu ka e nyere gị aka,Arụsị dị iche iche i kpokọtara agaghị anapụta gị.+
Ifufe ga-ebufu ha niile.
Ume nkịtị mmadụ kupụrụ ga-eburu ha.
Ma, onye ji m mere ebe mgbaba ga-eketa ala a,Nwetakwa ugwu nsọ m.+
14 A ga-asịkwa, ‘Rụọnụ ụzọ, rụọnụ ụzọ! Rụọnụ ya ka ọ dị mma.+
Wepụnụ ihe ọ bụla nọchiiri ndị m ụzọ.’”
15 Onye Dị Elu na Onye Ukwu,Onye na-adị ndụ* ruo mgbe ebighị ebi,+ onye aha ya dị nsọ,+ kwuru, sị:
“Ebi m ebe dị elu na ebe dị nsọ,+Ma, mụ na ndị obi gbawara na ndị dara mbà n’obi nọkwa,Iji gbaa ndị dara mbà n’obi ume,Meekwa ka obi sie ndị obi gbawara ike.+
16 N’ihi na agaghị m na-alụso ha ọgụ ruo mgbe ebighị ebi.
Agaghịkwa m na-ewe iwe mgbe niile.+
M ga-eme ka ike gwụ ndị mmadụ.+
M ga-emekwa ka ike gwụ ihe dị iche iche na-eku ume m kere.
17 Iwe were m n’ihi otú uru e ji aghụghọ erite si agụsi ya ike.+
Ọ bụ ya mere m ji taa ya ahụhụ, zoo ihu m, na-ewekwara ya iwe.
Ma, ọ nọ na-enupụ isi,+ na-eme ihe ọ bụla obi ya gwara ya.
18 Ahụla m otú o si eme.
Ma, m ga-agwọ ya,+ duziekwa ya.+
M ga-akasikwa ya na ndị so ya na-eru uju obi.”+
19 Jehova kwuru, sị: “M ga-eme ka ha na-eto m.
Udo ga-adịrị onye nọ ebe dị anya na onye nọ nso mgbe niile.+
M ga-agwọkwa ha.”
20 “Ma ndị ajọ omume yiri oké osimiri nke na-amali elu, nke na-enweghị ike ịdajụ,Nke mmiri ya na-abọlitekwa apịtị na ahịhịa ndị dị na ya.
21 Udo agaghị adịrị ndị ajọ omume.”+ Ọ bụ Chineke m kwuru ihe a.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ O nwere ike ịbụ, “na-aghọta na ọ bụ ọdachi gburu onye ezi omume.”
^ Na Hibru, “n’àkwà ha.”
^ Ma ọ bụ “hà ga-akasi m obi?”
^ Ma ọ bụ “ihe ndina.”
^ Ma ọ bụ “ihe ndina.”
^ O nwere ike ịbụ otú e si ekpere arụsị.
^ O nwere ike ịbụ, “eze.”
^ Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Na Hibru, “ike anaghị agwụ gị.”
^ Ma ọ bụ “ma zochie ihe i mere.”
^ Ma ọ bụ “Onye na-ebi.”