Abụ Ọma 4:1-8
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụbọ akwara kpọọ ya. Abụ Devid.
4 Mgbe m kpọrọ gị, biko za m, Chineke m onye ezi omume.+
Meere m ụzọ m ga-esi gbapụ* n’ahụhụ m na-ata.
Meere m amara, nụkwa ekpere m.
2 Unu ụmụ mmadụ, olee mgbe unu ga-akwụsị ịkpụ ùgwù m n’ala?
Olee mgbe unu ga-akwụsị ịhụ ihe efu n’anya na ịchọgharị ihe na-abụghị eziokwu? (Sila)
3 Maranụ na Jehova ga-emeso onye jisiri ya aka ike ihe otú pụrụ iche.
Jehova ga-anụ olu m ma m kpọọ ya.
4 Weenụ iwe, ma unu emehiela.+
Kwuonụ ihe unu chọrọ ikwu n’obi unu, n’elu àkwà* unu, ma gbanụ nkịtị. (Sila)
5 Jirinụ ezigbo obi chụọrọ Chineke àjà,Tụkwasịkwanụ Jehova obi.+
6 E nwere ọtụtụ ndị na-ajụ, sị: “Ònye ga-eme ka ihe ọma ruo anyị aka?”
Jehova, biko, meere anyị amara.*+
7 I meela ka ọṅụ ju m obiKarịa ọṅụ ndị mmadụ na-enwe mgbe ha nwetara ọka na mmanya ọhụrụ buru ibu n’ubi ha.
8 M ga-edina ala hie ụra n’udo,+N’ihi na ọ bụ naanị gị, Jehova, na-eme ka obi ruo m ala.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “Meere m ohere sara mbara.”
^ Ma ọ bụ “ihe ndina.”
^ Na Hibru, “mee ka ìhè si n’ihu gị nwuoro anyị.”