Ozi Ọma Jọn Dere 16:1-33

  • E nwere ike igbu ndị na-eso ụzọ Jizọs (1-4a)

  • Ihe mmụọ nsọ ga-eme (4b-16)

  • Ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-akwụsị iru uju (17-24)

  • Jizọs meriri ụwa (25-33)

16  “Agwala m unu ihe ndị a ka unu ghara ịdapụ n’okwukwe.*  Ndị mmadụ ga-achụpụ unu n’ụlọ nzukọ.+ N’eziokwu, oge na-abịa mgbe ndị mmadụ ga-egbu unu+ ma chee na ha jeere Chineke ozi dị nsọ.  Ma, ha ga-eme ihe ndị a n’ihi na ha amatabeghị ma Nna m ma mụnwa.+  Ma, agwala m unu ihe ndị a ka ọ ga-abụ oge ha ga-eme ruo, unu echeta na m gwara unu ha.+ “Agwaghị m unu ihe ndị a na mbụ maka na mụ na unu nọ.  Ma ugbu a, m na-alakwuru Onye zitere m,+ ma e nweghị otu onye n’ime unu jụrụ m, sị, ‘Ebee ka ị na-aga?’  Ma ihe ndị a m gwara unu emeela ka obi jọọ unu njọ.+  Ma, ana m agwa unu eziokwu, ọ bụ ka ihe dịrị unu ná mma mere m ji ala. N’ihi na ọ bụrụ na alaghị m, ihe inyeaka ahụ+ agaghị abịakwute unu. Ma ọ bụrụ na mụ alaa, m ga-ezitere unu ya.  Mgbe ọ ga-abịa, ọ ga-egosi ụwa ihe àmà doro anya gbasara mmehie, gbasara ezi omume nakwa gbasara ikpe:  nke mbụ, gbasara mmehie,+ n’ihi na ha enweghị okwukwe na m,+ 10  gbasara ezi omume, n’ihi na m na-alakwuru Nna m, unu agaghịzi ahụ m, 11  gbasara ikpe, n’ihi na e kpeela onye na-achị ụwa a ikpe.+ 12  “M ka nwere ọtụtụ ihe m ga-agwa unu, ma unu enweghị ike ịghọta ha ugbu a. 13  Ma, mgbe ihe inyeaka ahụ ga-abịa, bụ́ mmụọ nke eziokwu,+ ọ ga-edu unu ka unu ghọta eziokwu niile, n’ihi na ọ gaghị ekwu ihe bụ́ uche ya. Kama ihe ndị ọ nụrụ ka ọ ga-ekwu, ọ ga-akọkwara unu ihe ndị ka ga-emenụ.+ 14  Ọ* ga-enye m otuto+ n’ihi na ọ ga-esi n’aka m nweta ihe ọ ga-akọrọ unu.+ 15  Ihe niile Nna m nwere bụ nke m.+ Ọ bụ ya mere m ji kwuo na ọ* na-esi n’aka m enweta ihe ọ na-akọrọ unu. 16  N’oge na-adịghị anya, unu agakwaghị ahụ m,+ n’oge na-adịghịkwa anya, unu ga-ahụ m.” 17  Ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya wee gwa ibe ha, sị: “Gịnị ka ihe a ọ na-agwa anyị pụtara, ‘N’oge na-adịghị anya, unu agaghị ahụ m, n’oge na-adịghịkwa anya, unu ga-ahụ m,’ nakwa, ‘n’ihi na m na-alakwuru Nna m’?” 18  Ha wee na-asị: “Gịnị ka ‘oge na-adịghị anya’ ọ na-ekwu pụtara? Anyị amaghị ihe ọ na-ekwu.” 19  Jizọs ma na ha chọrọ ịjụ ya ajụjụ, ya asị ha: “Ùnu na-ajụrịta ibe unu ajụjụ maka na m sịrị: ‘N’oge na-adịghị anya, unu agaghị ahụ m, n’oge na-adịghịkwa anya, unu ga-ahụ m’? 20  N’eziokwu, ana m asị unu na unu ga-ebe ákwá ma tie mkpu arịrị, ma ụwa ga-aṅụrị ọṅụ. Unu ga-eru uju, ma a ga-eme ka unu kwụsị iru uju, nwewezie ọṅụ.+ 21  Mgbe nwaanyị na-amụ nwa, ọ na-ahụju anya maka na oge ọ ga-amụ nwa eruola. Ma mgbe ọ mụpụtara nwa, ọ naghịzi echeta ahụhụ ọ tara n’ihi ọṅụ ọ na-enwe na ọ mụọla mmadụ n’ụwa. 22  Otú ahụ ka ọ dịkwa unu. Unu na-eru uju ugbu a. Ma mgbe m ga-ahụ unu ọzọ, ọṅụ ga-eju unu obi,+ e nweghịkwa onye ga-anapụ unu ọṅụ unu. 23  N’ụbọchị ahụ, unu agaghị ajụ m ajụjụ ọ bụla. N’eziokwu, ana m asị unu na ọ bụrụ na unu arịọ Nna m ihe ọ bụla,+ ọ ga-enye ya unu n’aha m.+ 24  Ruo ugbu a, unu arịọbeghị otu mkpụrụ ihe n’aha m. Rịọnụ, unu ga-anatakwa, ka e wee mee ka ọṅụ unu zuo ezuo. 25  “Eji m ihe atụ gwa unu ihe ndị a. Oge na-abịa mgbe m na-agakwaghị eji ihe atụ agwa unu okwu, kama m ga-akọrọ unu ihe banyere Nna m otú doro anya. 26  N’ụbọchị ahụ, unu ga-arịọ Nna m arịrịọ n’aha m. Ma, anaghị m ekwu na ọ bụ m ga-arịọrọ unu arịrịọ. 27  N’ihi na Nna m hụrụ unu n’anya maka na unu hụrụ m n’anya,+ unu ekwerekwala na m bịara ka onye nnọchiteanya Chineke.+ 28  Abịara m n’ụwa ka onye nnọchiteanya Nna m. Ugbu a, ana m ahapụ ụwa, ana m alakwurukwa Nna m.”+ 29  Ndị na-eso ụzọ ya wee sị: “Ị na-ekwu okwu ugbu a otú doro anya, i jighịkwa ihe atụ ekwu ya. 30  Anyị amatala ugbu a na ị ma ihe niile, ọ dịghịkwa mkpa ka onye ọ bụla jụọ gị ajụjụ. Ọ bụ ya mere anyị ji kwere na i si n’ebe Chineke nọ bịa.” 31  Jizọs gwara ha, sị: “Ùnu ekwetala ugbu a? 32  Lee, oge na-abịa, n’eziokwu, o ruokwala, mgbe a ga-achụsasị unu, onye ọ bụla alaa n’ụlọ ya, unu ahapụkwa naanị m.+ Ma anọghị m naanị m n’ihi na Nna m nọnyeere m.+ 33  Agwala m unu ihe ndị a ka unu wee nwee udo n’ihi m.+ N’ụwa, a ga-akpagbu unu, ma nweenụ obi ike. Emeriela m ụwa.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “ghara ịda.”
Ya bụ, ihe inyeaka. Ihe inyeaka a bụ mmụọ nsọ, ọ bụghị onye.
Ya bụ, ihe inyeaka. Ihe inyeaka a bụ mmụọ nsọ, ọ bụghị onye.