Ekliziastis 12:1-14

  • Cheta Onye Ukwu kere gị tupu i mee agadi (1-8)

  • Isi ihe onye mkpọkọta kwuru (9-14)

    • Okwu ndị ma ihe dị ka ndụdụ e ji achị ehi (11)

    • Tụọ egwu ezi Chineke(13)

12  Cheta Onye Ukwu kere gị n’oge ị na-eto eto,+ tupu oge nsogbu eruo,+ tupu gị anọruo mgbe ị ga-asị: “Ndụ anaghị atọ m ụtọ”;  tupu anyanwụ na ìhè na ọnwa na kpakpando agbaa ọchịchịrị,+ mmiri erujuokwa ma zoo mgbe nnukwu mmiri ka zochara;  tupu ndị na-eche ụlọ nche amawa jijiji, ụmụ nwoke siri ike ehuru ehuru, ụmụ nwaanyị na-egwe nri akwụsị igwe nri maka na ha dịzi ole na ole, anya agbaakwa ụmụ nwaanyị ndị na-elepụ anya na windo ọchịchịrị;+  tupu oge a ga-emechi ọnụ ụzọ e si abanye n’okporo ámá, mgbe nkume e ji egwe nri na-anaghịzi adapụta ụda nke ọma, mgbe ubé nnụnụ ga na-akpọte gị n’ụra, mgbe olu ụmụ nwaanyị niile na-abụ abụ na-anaghịzi adapụta ụda.+  N’oge ahụ, ihe dị elu ga na-atụ gị egwu, ihe na-emenye ụjọ adịrịkwa n’okporo ámá. Osisi almọnd ga-ama ifuru,+ ụkpara adọkpụrụ onwe ya na-aga, mkpụrụ osisi kepa* agbawaakwa, n’ihi na mmadụ na-aga n’ụlọ ya nke ọ ga-ebite aka,+ ndị na-eru uju ana-agagharịkwa n’okporo ámá;+  tupu e wepụ ụdọ ọlaọcha, tupu a kụrie efere ọlaedo, tupu a kụwaa ite dị n’isi mmiri, tupu e gwepịakwa ihe a rụnyere n’olulu mmiri e ji esepụta mmiri.  Ájá ewee laghachi n’ala,+ bụ́ ebe ọ dịbu, ume ndụ* alaghachikwuru ezi Chineke onye nyere ya mmadụ.+  Onye mkpọkọta+ kwuru, sị, “Ihe niile bụ nnọọ ihe efu! E nweghị ihe nwere isi.”+  Ọ bụghị naanị na onye mkpọkọta ma ihe, kama ọ na-akụzikwara ndị mmadụ ihe ọ ma n’oge niile.+ O chere echiche ma leba ihe dị iche iche anya nke ọma ka o wee dee* ọtụtụ ilu.+ 10  Onye mkpọkọta gbara mbọ chọta okwu ndị dị ụtọ+ ma dee okwu ndị e ji n’aka na ha bụ eziokwu. 11  Okwu ndị ma ihe dị ka ndụdụ e ji achị ehi,+ okwu ndị ha leziri anya kwuo dịkwa ka ntu a kụmiri akụmi. Okwu ndị ahụ si n’ọnụ otu onye na-azụ atụrụ. 12  Nwa m, m na-adọ gị aka ná ntị gbasara ihe ọ bụla na-esoghị n’ihe ndị a m kwuru: E nweghị mgbe ndị mmadụ ga-akwụsị ide ọtụtụ akwụkwọ ha na-ede, ike ga-agwụkwa ndị ji oge ha niile na-agụ ha niile.+ 13  Ihe bụ́ isi n’ihe niile e kwuru bụ: Tụọ egwu ezi Chineke,+ debekwa iwu ya,+ n’ihi na ọ bụ ihe kacha mkpa mmadụ kwesịrị ime.+ 14  N’ihi na ezi Chineke ga-ekpe ndị mmadụ ikpe maka ihe niile ha na-eme, ma ihe ọ bụla zoro ezo, ka o wee kpebie ma ọ̀ bụ ihe ọma ka ọ̀ bụ ihe ọjọọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Mkpụrụ osisi a na-eme ka agụụ gụwa mmadụ.
Na Hibru, “mmụọ.”
Ma ọ bụ “hazie.”