Job 35:1-16
35 Elaịhu kwukwara, sị:
2 “Obi ò siri gị nnọọ ike na ị bụ onye ezi omume nke na ị na-asị,‘Abụ m onye ezi omume karịa Chineke’?+
3 N’ihi na ị na-asị, ‘Ọ bụrụ na m na-eme ihe dị mma, olee otú o si gbasa gị?*
Ihe ọ̀ gaara akara m mma ma a sị na m mere mmehie?’+
4 M ga-asa gị okwu,Saakwa ndị enyi gị+ gị na ha nọ.
5 Lelie anya n’eluigwe ka ị hụ,Leruo ígwé ojii nke dị ezigbo elu karịa gị anya.+
6 I mee mmehie, è nwere ihe i metere Chineke?+
Ọ bụrụ na ị na-eme ihe ọjọọ ọtụtụ ugboro, olee ihe i metere ya?+
7 Ọ bụrụ na ị bụ onye ezi omume, gịnị ka ị na-enye ya?
Gịnị ka ọ na-enweta n’aka gị?+
8 Ọ bụ naanị mmadụ ibe gị ka ihe ọjọọ ị na-eme gbasara,Ọ bụkwa mmadụ ka ezi omume ị na-eme na-abara uru.
9 Ndị mmadụ na-ebe ákwá ka e nyere ha aka mgbe a na-emegbu ha.
Ha na-ebe ákwá ka a napụta ha n’aka ndị dike na-achị ha.+
10 Ma e nweghị onye na-ajụ, sị, ‘Olee ebe Chineke, bụ́ Onye Ukwu kere m, nọ,+Onye na-eme ka ndị mmadụ na-abụ abụ otuto n’abalị?’+
11 Ọ na-akụziri anyị ihe+ ka anyị wee mara ihe karịa anụ ọhịa,+Ọ na-emekwa ka anyị mara ihe karịa ụmụ nnụnụ.
12 Ndị mmadụ na-ebe ákwá ka e nyere ha aka, ma ọ naghị aza,+N’ihi na ndị na-eme ihe ọjọọ dị mpako.+
13 N’eziokwu, Chineke anaghị anụ ákwá aghụghọ.+
Onye Pụrụ Ime Ihe Niile enweghị ihe o ji ya kpọrọ,
14 Ma ya fọdụzie mgbe ị na-asị na ị naghị ahụ ihe ọ na-eme.+
Ikpe gị dị n’aka ya. N’ihi ya, i kwesịrị ichere ya.+
15 N’ihi na o jibeghị iwe kpọọ gị ka ị zaa ya ajụjụ.
O tinyebeghị uche n’ọnụ ị na-agbakasịrị ya.+
16 Job na-emeghe ọnụ ya na nkịtị.
Ọ na-ekwu ọtụtụ okwu n’agbanyeghị na e nweghị ihe ọ ma.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ O nwere ike ịbụ Chineke ka ọ na-agwa.