Ozi Ọma Luk Dere 5:1-39

  • E ji ọrụ ebube gbute azụ̀; ndị mbụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs (1-11)

  • A gwọrọ onye ekpenta (12-16)

  • Jizọs gwọrọ onye ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ (17-26)

  • Mgbe Jizọs kpọrọ Livaị (27-32)

  • Ajụjụ gbasara ibu ọnụ (33-39)

5  N’otu oge, Jizọs guzo n’akụkụ ọdọ mmiri Genesaret,*+ ìgwè mmadụ ana-enu ibe ha aka ka ha ruo ya nso gere okwu Chineke.  O wee hụ ụgbọ abụọ a dọsara n’akụkụ ọdọ mmiri ahụ, ma ndị ọkụ azụ̀ esila na ha pụta na-asacha ụgbụ ha.+  Ka ọ banyere n’otu n’ime ụgbọ ndị ahụ, ọ gwara Saịmọn, onye nwe ụgbọ ahụ, ka ọ kwọrọ ya banyekwuo na mmiri. O wee nọrọ n’ụgbọ ahụ, malitekwa izi ìgwè mmadụ ahụ ihe.  Mgbe ọ kwụsịrị ịgwa ìgwè mmadụ ahụ okwu, ọ sịrị Saịmọn: “Kwọrọ ụgbọ a banye n’ebe miri emi, wụnyekwanụ ụgbụ unu ka unu gbute azụ̀.”  Ma Saịmọn sịrị ya: “Onye Ozizi, n’agbanyeghị anya niile anyị mụrụ n’abalị, anyị egbuteghị ihe ọ bụla.+ Ma, ebe ị sị m wụnye ụgbụ na mmiri, m ga-awụnye ya.”  Mgbe ha wụnyere ya, ha gbutere ọtụtụ azụ̀, nke mere na ụgbụ ha malitere ịdọka.+  N’ihi ya, ha feere ndị ibe ha nọ n’ụgbọ nke ọzọ aka ka ha bịa nyere ha aka. Ha bịakwara kpojuo ụgbọ abụọ ahụ, nke mere na ụgbọ ndị ahụ malitere imi.  Mgbe Saịmọn Pita hụrụ ihe a, ọ dara n’ala n’ụkwụ Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, si ebe m nọ pụọ, n’ihi na abụ m onye mmehie.”  N’ihi na mgbe ha gbutere azụ̀ ndị ahụ, o juru ya na ndị niile ya na ha nọ anya. 10  O jukwara ma Jems ma Jọn, ụmụ Zebedi,+ anya, bụ́ ndị ha na Saịmọn na-arụkọ ọrụ. Ma Jizọs sịrị Saịmọn: “Kwụsị ịtụ egwu. Si ugbu a gawa, ị ga na-akụta ndị mmadụ ná ndụ.”+ 11  N’ihi ya, ha kwọọrọ ụgbọ ndị ahụ gaghachi n’elu ala. Ha hapụkwara ihe niile soro ya.+ 12  N’oge ọzọ, ka Jizọs nọ n’otu n’ime obodo ndị ahụ, otu nwoke ekpenta zuru ahụ́ hụrụ ya, gbuo ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala, rịọ ya, sị: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ị chọrọ, ị ga-emeli ka m dị ọcha.”+ 13  O wee matịa aka bitụ ya aka, sị: “Achọrọ m. Dị ọcha.” Ozugbo ahụ, a gwọrọ ya ekpenta ya.+ 14  O wee gwa nwoke ahụ ka ọ ghara ịkọrọ onye ọ bụla. Ọ sịrị ya: “Kama gaa gosi onye nchụàjà onwe gị, nyekwa ihe Mosis kwuru na onye ekpenta ga-enye ma ọ dị ọcha,+ ka e wee mara na a gwọọla gị.”+ 15  Ma akụkọ banyere ya nọ na-agbasa, oké ìgwè mmadụ na-agbakọtakwa ka ha gee ya ntị, ka ọ gwọọkwa ha ọrịa ha.+ 16  Ma, ọ na-agakarị ikpe ekpere ebe ndị mmadụ na-anaghị anọkarị. 17  E nwere otu ụbọchị ọ nọ na-ezi ihe, ndị Farisii na ndị na-akụzi Iwu, bụ́ ndị si n’obodo niile dị na Galili na Judia na Jeruselem bịa, nọkwa ọdụ n’ebe ahụ. Jehova* nyekwara ya ike ọ ga-eji na-agwọ ọrịa.+ 18  Ma, e nwere ụmụ nwoke ji àkwà* buru otu nwoke ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ha nọkwa na-achọ ụzọ ha ga-esi bubata ya ma dọwa ya n’ihu Jizọs.+ 19  Ma, n’ihi ìgwè mmadụ ahụ, ha ahụghị ụzọ ha ga-esi buba ya. N’ihi ya, ha rịgooro n’elu ụlọ, sikwa n’uko ụlọ buda ya na àkwà ahụ n’etiti ndị nọ n’ihu Jizọs. 20  Mgbe Jizọs hụrụ na ha nwere okwukwe, ọ sịrị: “Nwoke m, a gbagharala gị mmehie gị.”+ 21  Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii wee malite ịgwa ibe ha, sị: “Ònye bụ onye a na-ekwulu Chineke? Ònye ga-agbagharali mmehie ma ọ́ bụghị naanị Chineke?”+ 22  Ma ebe ọ bụ na Jizọs ma ihe ha na-eche, ọ gwara ha, sị: “Gịnị ka unu na-eche n’obi unu? 23  Olee nke ka mfe? Ọ̀ bụ ịsị, ‘A gbagharala gị mmehie gị,’ ka ọ̀ bụ ịsị, ‘Bilie gawa ije’? 24  Ma, ka unu wee mara na Nwa nke mmadụ nwere ikike n’ụwa ịgbaghara mmehie—” ọ gwara nwoke ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, sị: “Ana m asị gị, Bilie buru àkwà* gị, lawa n’ụlọ gị.”+ 25  O wee bilie n’ihu ha, buru àkwà* ya lawa n’ụlọ ya, na-eto Chineke. 26  O wee ju ha niile anya, ha amalitekwa ito Chineke. Egwu wee jide ha, ha ana-asị: “Anyị ahụla ihe dị ebube taa.” 27  Mgbe ihe a mechara, Jizọs pụrụ hụ otu onye ọnaụtụ aha ya bụ Livaị ka ọ nọ ọdụ n’ebe a na-anakọta ụtụ. O wee sị ya: “Bụrụ onye na-eso ụzọ m.”+ 28  Ọ hapụkwara ihe niile, bilie soro ya. 29  Livaị mekwaara ya oké oriri n’ụlọ ya, e nwekwara ìgwè ndị ọnaụtụ na ndị ọzọ ndị ha na ha nọ na-eri nri.+ 30  N’ihi ya, ndị Farisii na ndị òtù ha bụ́ ndị odeakwụkwọ malitere ịtamu ntamu na-asị ndị na-eso ụzọ ya: “Gịnị mere unu ji soro ndị ọnaụtụ na ndị mmehie na-eri ihe, na-aṅụkwa mmanya?”+ 31  Jizọs sịrị ha: “Ndị ahụ́ dị anaghị achọ onye ga-agwọ ha, kama ọ bụ ndị ahụ́ na-adịghị na-achọ ya.+ 32  Ọ bụghị ndị ezi omume ka m bịara ịkpọ, kama abịara m ịgwa ndị mmehie ka ha chegharịa.”+ 33  Ha asị ya: “Ndị na-eso ụzọ Jọn na-ebu ọnụ ugboro ugboro, na-ekpesikwa ekpere ike. Otú ahụkwa ka ndị na-eso ụzọ ndị Farisii na-eme. Ma ndị na-eso ụzọ gị na-eri ihe, na-aṅụkwa mmanya.”+ 34  Jizọs asị ha: “Unu agaghị emeli ka ndị enyi nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ na-ebu ọnụ mgbe ha na nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ nọ. 35  Ma, oge na-abịa mgbe a ga-akpọpụ nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ+ n’ebe ha nọ. Ha ga-ebuzi ọnụ mgbe ahụ.”+ 36  O mekwaara ha otu ihe atụ, sị: “E nweghị onye na-esi n’uwe elu ọhụrụ achabita ibé ákwà ma dụnye ya n’uwe elu ochie. Ọ bụrụ na mmadụ emee otú ahụ, ibé ákwà ọhụrụ ahụ na-adọkapụ, ibé ákwà nke si n’uwe ọhụrụ ahụ na nke ochie ahụ agaghịkwa agakọ.+ 37  E nweghịkwa onye na-agbanye mmanya ọhụrụ n’ime karama akpụkpọ ochie. Ọ bụrụ na mmadụ emee otú ahụ, mmanya ọhụrụ ahụ ga-agbawa karama akpụkpọ ahụ, mmanya ahụ ga-awụfukwa, karama akpụkpọ ahụ emebiekwa. 38  Kama e kwesịrị ịgbanye mmanya ọhụrụ n’ime karama akpụkpọ ọhụrụ. 39  E nweghị onye ṅụrụ mmanya ochie nke na-achọ nke ọhụrụ, n’ihi na ọ na-asị, ‘Nke ochie dị mma.’”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, Oké Osimiri Galili.
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “ihe ndina.”
Ma ọ bụ “ihe ndina.”
Ma ọ bụ “ihe ndina.”