Ozi Ọma Luk Dere 7:1-50
7 Mgbe ọ gwachara ìgwè mmadụ ahụ ihe niile ọ chọrọ ịgwa ha, ọ banyere Kapaniọm.
2 Ma, e nwere otu onyeisi ndị agha ohu ya ọ hụrụ n’anya na-arịa ọrịa, nọrọkwa n’ọnụ ọnwụ.+
3 Mgbe ọ nụrụ banyere Jizọs, o ziri ụfọdụ ndị okenye ndị Juu ka ha gaa rịọ ya ka ọ bịa gwọọ ohu ya.
4 Ha bịakwutere Jizọs malite ịrịọsi ya ike, sị: “Nwoke a kwesịrị ka i meere ya ihe a,
5 n’ihi na ọ hụrụ obodo anyị n’anya, ọ rụkwaara anyị ụlọ nzukọ.”
6 N’ihi ya, Jizọs sooro ha gawa. Ma mgbe o rutewere ụlọ onyeisi ndị agha ahụ nso, nwoke ahụ ziri ndị enyi ya ka ha gwa Jizọs, sị: “Nna anyị ukwu, enyela onwe gị nsogbu, n’ihi na ekwesịghị m ka ị bata n’ụlọ m.+
7 Ọ bụ ya mere na mụ abịaghị n’onwe m. Kama kwuo naanị okwu, ahụ́ ga-adịkwa onye na-ejere m ozi mma.
8 N’ihi na n’agbanyeghị na m nọ n’okpuru ndị ọzọ, e nwekwara ndị agha nọ n’okpuru m. M na-asị onye agha nke a, ‘Gawa!’ ya agawa. M na-asịkwa onye nke ọzọ, ‘Bịa!’ ya abịa. M na-asịkwa ohu m, ‘Mee nke a!’ ya emee ya.”
9 Mgbe Jizọs nụrụ ihe ndị a, o juru ya anya, ya atụgharịa chee ìgwè mmadụ na-eso ya n’azụ ihu, sị ha: “Ana m asị unu, ahụtụbeghị m onye okwukwe ya siri ike otú a n’Izrel.”+
10 Mgbe ndị ahụ e ziri ozi laghachiri n’ụlọ ahụ, ha hụrụ na ahụ́ adịla ohu ahụ mma.+
11 Obere oge ihe a mechara, ọ gawara obodo a na-akpọ Nen, ndị na-eso ụzọ ya na ìgwè mmadụ sokwa ya na-aga.
12 Ka o rutere nso n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ, e nwere onye nwụrụ anwụ a na-ebupụ. Ọ bụ nwa nwoke nne ya mụrụ naanị ya.+ Nne ya bụkwa nwaanyị isi mkpe. Ọtụtụ ndị obodo ahụ sokwa ya.
13 Mgbe Onyenwe anyị hụrụ ya, o meteere ya ebere,+ wee sị ya: “Ebezila.”+
14 O wee garuo nso bitụ ihe ahụ e ji buru ozu ahụ aka, ndị bu ya eguzoro otu ebe. O wee sị: “Nwa okorobịa, ana m asị gị, bilie!”+
15 Onye ahụ nwụrụ anwụ wee bilie nọrọ ọdụ, malite ikwu okwu, Jizọs akpọnyezie ya nne ya.+
16 Egwu wee jide ha niile, ha amalitekwa ito Chineke, na-asị: “Nnukwu onye amụma abịakwutela anyị.”+ Ha ana-asịkwa, “Chineke echetala ndị ya.”+
17 Akụkọ ihe a o mere wee gbasaa ebe niile na Judia na obodo niile gbara ya gburugburu.
18 Ndị na-eso ụzọ Jọn kọkwaara ya ihe a niile.+
19 N’ihi ya, Jọn kpọrọ mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya ma zie ha ka ha gakwuru Onyenwe anyị, sị ya: “Ọ̀ bụ gị bụ Onye anyị na-atụ anya ya kemgbe,+ ka è nwere onye ọzọ ga-abịa?”
20 Mgbe ụmụ nwoke ahụ bịakwutere ya, ha sịrị ya: “Jọn Onye Na-eme Baptizim ziri anyị ka anyị bịa jụọ gị, sị, ‘Ọ̀ bụ gị bụ Onye anyị na-atụ anya ya kemgbe, ka è nwere onye ọzọ ga-abịa?’”
21 N’oge ahụ, ọ gwọrọ ọtụtụ mmadụ ọrịa dị iche iche ha na-arịa,+ chụpụ ndị mmụọ ọjọọ, meekwa ka ọtụtụ ndị ìsì hụwa ụzọ.
22 O wee sị ha: “Gaanụ kọọrọ Jọn ihe unu hụrụ na ihe unu nụrụ: Ndị ìsì na-ahụzi ụzọ,+ ndị ngwọrọ na-ejekwa ije. A na-eme ka ndị ekpenta dị ọcha, ndị ntị chiri na-anụkwa ihe.+ A na-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, a na-ezikwa ndị ogbenye ozi ọma.+
23 Onye ihe gbasara m na-anaghị eme obi abụọ* na-enwe obi ụtọ.”+
24 Mgbe ndị Jọn ziri ozi lawara, Jizọs malitere ịgwa ìgwè mmadụ ahụ banyere Jọn, sị: “Gịnị ka unu gara ịhụ n’ala ịkpa? Ọ̀ bụ ahịhịa amị nke ifufe na-ebugharị?+
25 Gịnịzi ka unu gara ịhụ? Ọ̀ bụ onye yi uwe mara mma?*+ N’eziokwu, ndị yi uwe mara mma ma na-ebi ndụ okomoko nọ n’ụlọ ndị eze.
26 Gịnịkwanụ ka unu gara ịhụ? Ọ̀ bụ onye amụma? N’eziokwu, ana m asị unu, ọ bụ onye karịrị onye amụma.+
27 Onye a bụ onye ahụ e dere banyere ya, sị: ‘Lee, m na-ezipụ onye ozi m ga-ebu gị ụzọ bịa,* ọ ga-edozikwa ụzọ ị ga-esi bịa.’+
28 Ana m asị unu, n’ime ndị niile ụmụ nwaanyị mụrụ, o nweghị onye ka Jọn ukwuu, ma onye dị ala n’Alaeze Chineke ka ya ukwuu.”+
29 (Mgbe ndị ọnaụtụ na mmadụ niile nụrụ ya, ha kwuru na Chineke bụ onye ezi omume, n’ihi na ọ bụ Jọn mere ha baptizim.+
30 Ma ndị Farisii na ndị ma Iwu ledara ndụmọdụ* Chineke nyere ha anya,+ ebe ọ bụ na Jọn emeghị ha baptizim.)
31 “Oleezi ndị m kwesịrị iji ọgbọ a tụnyere? Oleekwa ndị ha yiri?+
32 Ha yiri ụmụaka ndị nọ ọdụ n’ọma ahịa na-agwa ibe ha, sị: ‘Anyị gbuuru unu ọjà, ma unu agbaghị egwú. Anyị bere ezigbo ákwá, ma unu ebeghị ákwá.’
33 Jọn Onye Na-eme Baptizim bịakwara, ọ naghị ata achịcha, ọ naghịkwa aṅụ mmanya,+ ma unu na-asị: ‘Mmụọ ọjọọ ji ya.’
34 Nwa nke mmadụ bịara na-eri ihe, na-aṅụkwa mmanya, ma unu na-asị: ‘Ọ na-eri oké nri, na-aṅụkwa oké mmanya. Ọ bụ enyi ndị ọnaụtụ na ndị mmehie.’+
35 Ma, ihe na-egosi na mmadụ ma ihe bụ ihe ndị dị mma ọ na-eme.”+
36 Ma otu onye n’ime ndị Farisii nọ na-arịọ ya ka ọ bịa na nke ya. N’ihi ya, ọ gara n’ụlọ onye Farisii ahụ nọdụ na-eri ihe na tebụl.
37 Ma, otu nwaanyị a ma n’obodo ahụ na ọ bụ onye mmehie matara na ọ nọ na-eri ihe n’ụlọ onye Farisii ahụ, o wee weta mkpọ̀ alabasta nke mmanụ na-esi ísì ọma dị n’ime ya.+
38 Ọ gara n’azụ Jizọs nọrọ n’akụkụ ụkwụ ya na-ebe ákwá, ma bido iji anya mmiri ya na-ede ụkwụ ya, jirikwa ntutu isi ya na-ehicha ụkwụ ya. O jikwa nwayọọ susuo ụkwụ ya ọnụ ma wụọ mmanụ ahụ na-esi ísì ọma n’ụkwụ ya.
39 Mgbe onye Farisii ahụ kpọrọ Jizọs hụrụ ihe a, o kwuru n’obi ya, sị: “A sị na nwoke a bụ onye amụma n’eziokwu, ọ gaara ama onye na-ebitụ ya aka, marakwa ụdị nwaanyị ọ bụ, na ọ bụ onye mmehie.”+
40 Ma Jizọs sịrị ya: “Saịmọn, e nwere ihe m chọrọ ịgwa gị.” Ya asị: “Onye Ozizi, kwuwe.”
41 “Mmadụ abụọ ji otu onye na-agbazinye ndị mmadụ ego ụgwọ. Otu onye ji ya narị mkpụrụ ego dinarịọs* ise (500), ma onye nke ọzọ ji ya iri ise.
42 Mgbe ha na-enweghị ihe ọ bụla ha ga-eji kwụọ ụgwọ ha ji, ọ gbaghaara ha abụọ kpamkpam. Olee onye nke ga-aka ahụ ya n’anya?”
43 Saịmọn asị ya: “Echere m na ọ bụ onye nke ahụ ụgwọ o ji ka.” Ya asị ya: “Ị zatara ya.”
44 O wee tụgharịa lee nwaanyị ahụ anya, sị Saịmọn: “Ị̀ hụrụ nwaanyị a? Abatara m n’ụlọ gị, i nyeghị m mmiri ka m saa ụkwụ. Ma nwaanyị a ji anya mmiri ya dee ụkwụ m, jirikwa ntutu isi ya hichaa ya.
45 I susughị m ọnụ,* ma kemgbe m batara, nwaanyị a akwụsịghị isusu ụkwụ m ọnụ.
46 Ị wụghị m mmanụ n’isi, ma nwaanyị a wụrụ mmanụ na-esi ísì ọma n’ụkwụ m.
47 N’ihi ya, ana m asị gị, a gbagharala ya mmehie ya n’agbanyeghị na ọ dị ọtụtụ,+ n’ihi na ọ hụrụ m n’anya nke ukwuu. Ma onye a gbaghaara ntakịrị ihe anaghị ahụ ndị mmadụ n’anya nke ukwuu.”
48 O wee sị nwaanyị ahụ: “A gbagharala gị mmehie gị.”+
49 Ndị ya na ha nọ na-eri ihe na tebụl wee malite ịgwa ibe ha, sị: “Ònye bụ onye a na-agbaghara mmehie?”+
50 Ma ọ sịrị nwaanyị ahụ: “Okwukwe gị azọpụtala gị.+ Lawa n’udo.”
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “Onye na-enweghị ihe mere ọ ga-eji hapụ inwe okwukwe na m.”
^ Ma ọ bụ “uwe dị yọrịị.”
^ Na Grik, “n’ihu gị.”
^ Ma ọ bụ “ntụziaka.”
^ Otú e si ekele mmadụ n’oge ahụ bụ isusu ya ọnụ, dị ka isusu ya ọnụ na ntì.