Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Nyere Iwu Banyere Ịdị Ọcha Tupu Ndị Sayensị Amata Uru Ọ Bara

Chineke Nyere Iwu Banyere Ịdị Ọcha Tupu Ndị Sayensị Amata Uru Ọ Bara

 Obere oge tupu ụmụ Izrel abanye n’Ala Nkwa ahụ, n’ihe dị ka puku afọ atọ na narị ise gara aga, Chineke gwara ha na ya ga-eme ka ha ghara ịrịa “ọrịa ọjọọ niile” ndị ha ji anya ha hụ n’Ijipt. (Diuterọnọmi 7:15) Otu ụzọ o si mee ya bụ inye ha ntụziaka gbasara ịdị ọcha, na otú ha ga-esi na-egbochi ma ọ bụ na-akwụsị ọrịa. Dị ka ihe atụ:

  •   Iwu e nyere mba ahụ kwuru na ha kwesịrị ịna-asa ahụ́ ma na-asụ ákwà ha.​—Levitikọs 15:​4-27.

  •   Chineke gwara ha gbasara nsị mmadụ, sị: “Ị ga-enwe ebe ị ga na-eje mposi ná mpụga ebe ị mara ụlọikwuu, ị ga-apụkwa gaa ebe ahụ. Ị ga-eji mbazụ, ya na ihe agha gị, ọ ga-erukwa na mgbe ị ga-etukwuru ala n’ebe mpụga ahụ, ị ga-eji ya gwuo ala ma tụgharịa kpochie nsị gị.”​—Diuterọnọmi 23:​12, 13.

  •   A na-akpọpụ ndị e chere na ha na-arịa ọrịa na-efe efe iche ruo oge ụfọdụ. Tupu ha alaghachi, ndị a chọpụtara na ọrịa ha alaala ga-asụ uwe ha ma saa ahụ́ na mmiri wee dị “ọcha.”​—Levitikọs 14:​8, 9.

  •   A na-akpọpụ onye ọ bụla metụrụ ozu aka iche.​—Levitikọs 5:​2, 3; Ọnụ Ọgụgụ 19:16.

 Iwu e nyere ụmụ Izrel ọtụtụ afọ gara aga gosiri otú e kwesịrị isi na-agwọ ọrịa ma na-edebe ihe ọcha.

 Ma mba ndị gbara ụmụ Izrel gburugburu adịghị ele ịdị ọcha anya ka ihe dị mkpa. Dị ka ihe atụ:

  •   Ha na ekpofu unyi n’okporo ụzọ. Mmiri ndị e metọrọ emetọ, nri ndị mebiri emebi nakwa ụdị unyị ndị ọzọ mere ka ọtụtụ mmadụ rịawa ọrịa, kpatakwa ọnwụ ọtụtụ ụmụaka.

  •   Ndị dọkịta oge ochie matụ ma ọ bụ ha amaghị gbasara ụmụ nje dị iche iche na-akpata ọrịa. Ndị Ijipt na-eji ọbara ngwere, nsị okwolo, òké nwụrụ anwụ, mamịrị na bred mara ebu agwọ ọrịa. Ihe ndị a agwọghị ọrịa ọ bụla, kama, o nwedịrị ike ịbụ na ha mere ka ọrịa ka njọ. Ha na-ejikarịkwa nsị mmadụ na nke anụmanụ agwọ ọrịa.

  •   Ndị Ijipt butere ọrịa dị iche iche n’Osimiri Naịl nakwa n’ọwa mmiri dị iche iche n’ihi ụmụ nje ndị dị na ha nakwa n’ihi mmetọ e metọrọ ha. Afọ ọsịsa na ọrịa ndị ọzọ gbukwara ọtụtụ ụmụaka n’Ijipt n’ihi iri nri mebiri emebi.

 Ma ụmụ Izrel nọgidere na-enwe ahụ́ ike n’ihi irubere Iwu Chineke isi.