NA-ECHENỤ NCHE!
Olee Mgbe A Ga-akwụsị Ịlụ Agha Ndị A Na-alụ Ugbu A?—Gịnị Ka Baịbụl kwuru?
Mgbe ndị Ịran tụchara ndị Izrel bọmb n’abalị iri na atọ n’ọnwa Eprel afọ 2024, António Guterres, bụ́ odeakwụkwọ ukwu Òtù Mba Ụwa, kwuru, sị: “Ugbu a bụ oge ime udo na ime ka agha a ghara ịgbasa. Ugbu a bụ oge ndị ọ bụla ga-ahapụ imegwara ihe e mere ha.”
Otú ahụ a na-alụ agha n’Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu ka a na-alụkwa ya ebe dị iche iche n’ụwa.
N’abalị iri abụọ na isii n’ọnwa Jenụwarị afọ 2023, Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Udo kwuru, sị: “Kemgbe a lụchara agha ụwa nke abụọ, e nwetụbeghị mgbe ọzọ agha juru ebe niile n’ụwa otú o juru taa. Agha ndị a na-akpa ijeri mmadụ abụọ aka, ya bụ, ihe dị ka otu onye n’ime mmadụ anọ ọ bụla nọ n’ụwa.”
Ebe ụfọdụ a na-alụ agha n’ụwa ugbu a bụ Izrel, Gaza, Siria, Azebaịjan, Yukren, Sudan, Etiopia, Nijie (Rịpọblik), Mianmaa, na Heiti. a
Olee mgbe a ga-akwụsị ịlụ agha ndị a niile? Ndị ọchịchị ụwa hà ga-emeli ka udo dị? Gịnị ka Baịbụl kwuru?
Ụwa agha juru na ya
Agha a na-alụ n’ebe dị iche iche n’ụwa taa na-egosi na oge a ga-akwụsị ịlụ agha ebe niile n’ụwa eruola eruo. Agha ndị a a na-alụ na-emezu amụma ndị Baịbụl buru gbasara ihe ndị ga na-eme n’oge a anyị bi na ya. Baịbụl kpọrọ oge a anyị bi na ya “ọgwụgwụ oge.”—Matiu 24:3.
“Unu ga-anụ mkpọtụ agha na akụkọ agha. . . . Mba ga-alụso mba ọzọ agha, alaeze ga-alụsokwa alaeze ọzọ agha.”—Matiu 24:6, 7.
Gụọ isiokwu bụ́ “Olee Ihe Na-egosi na Anyị Nọ n’Oge Ikpeazụ?” ka ị hụ otú agha ndị a na-alụ taa si emezu amụma Baịbụl.
Agha nke ga-akwụsị agha niile
Baịbụl kwuru na agha niile ụmụ mmadụ na-alụ ga-akwụsị. Gịnị ga-eme ka ha kwụsị? Ọ bụghị mbọ ụmụ mmadụ na-agba ga-eme ya, kama, ọ bụ Amagedọn, ya bụ, “agha a ga-alụ n’oké ụbọchị Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.” (Mkpughe 16:14, 16) A lụchaa agha a, Chineke ga-eme ka ụmụ mmadụ biri n’udo ruo mgbe ebighị ebi otú o kwere ná nkwa.—Abụ Ọma 37:10, 11, 29.
Ị chọọ ịmatakwu gbasara agha Chineke ga-eji kwụsị agha ndị ọzọ niile, gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Bụ Agha Amagedọn?”
a Ebe e si nweta ihe a bụ n’isiokwu bụ́ “Ranking violent conflict levels across the world.” Ọ bụ ndị a kpọrọ ACLED Conflict Index bipụtara ya n’ọnwa Jenụwarị afọ 2024.