Rite Uru n’Àjà Jizọs Ji Ndụ Ya Chụọ
Otu ugboro n’afọ ọ bụla, Ndịàmà Jehova na ọtụtụ nde ndị ha kpọrọ òkù n’ebe niile n’ụwa na-ezukọta ka ha mee Ncheta Ọnwụ Jizọs, otú ahụ Jizọs nyere n’iwu. (Luk 22:19) Anyị na-eji oge a egosi na obi dị anyị ụtọ maka àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ maka ụmụ mmadụ. Ọ na-echetakwara anyị uru àjà ọ chụrụ ga-abara anyị ma ugbu a ma n’ọdịnihu.—Jọn 3:16.
Ma ị̀ gara Ncheta Ọnwụ Jizọs n’afọ a ma ọ bụ na ị gaghị, olee otu ị ga-esi rite uru n’ọnwụ Jizọs nwụrụ n’ihi anyị? Jizọs kwuru ihe abụọ dị ezigbo mkpa anyị kwesịrị ime:
1. Mụọ banyere Chineke na Jizọs. Jizọs gwara Nna ya nke eluigwe n’ekpere, sị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ha ga-amata gị, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”—Jọn 17:3.
2. Na-eme ihe ị na-amụta. Jizọs kwuru na anyị kwesịrị ịna-eme ihe ndị ọ kụziri. Dị ka ihe atụ, n’okwu ikpeazụ ndị o kwuru n’ihe ọ nọ n’elu ugwu kụzie, ọ jara onye ọ bụla ‘na-anụ okwu ya, na-emekwa ha,’ mma. (Luk 6:46-48) N’oge ọzọ, Jizọs kwukwara, sị: “Ọ bụrụ na unu ma ihe ndị a, unu ga-enwe obi ụtọ ma unu na-eme ha.”—Jọn 13:17.
Ị̀ ga-achọ ịmatakwu banyere Chineke na Jizọs? Ị̀ ga-achọ ịmatakwu otú ị ga-esi na-eme ihe ị na-amụta? Lee ụfọdụ ihe ndị nwere ike inyere gị aka.
Ịmụ Baịbụl
Anyị na ndị mmadụ na-amụ Baịbụl na-anaghị ha ego. Ihe a enyerela ọtụtụ ndị aka ịchọpụta ihe Baịbụl na-akụzi nakwa otú ha ga-esi na-eme ya na ndụ ha.
Gaa n’ebe a kpọrọ Guided Bible Study Course ka ị matakwuo otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl.
Lee vidio bụ́ Obi Dị Anyị Ụtọ na Ị Chọrọ Ịmu Baịbụl ka ị hụ otú Ndịàmà Jehova na ndị mmadụ si amụ Baịbụl.
Ọmụmụ Ihe Ndịàmà Jehova
Ndịàmà Jehova na-ezukọ ugboro abụọ n’izu ọ bụla ka ha fee Chineke n’ebe a na-akpọ Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’ọmụmụ ihe anyị a, anyị na-amụ Baịbụl, mụọkwa otú anyị ga-esi na-eme ihe Baịbụl kwuru.
Onye ọ bụla nwere ike ịbịa nnọkọ ndị a. Ọ bụghị iwu na ị ga-abụrịrị Onyeàmà Jehova tupu gị abịa. Ị ga-eji otú ihe si dị ebe i bi mara ma ị̀ ga-abịa ihu na ihu ma ị̀ ga-esi n’Ịntanet gere ya.
Lee vidio isiokwu ya bụ Gịnị Ka A Na-eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze? ka ị hụ otú ọmụmụ ihe anyị na-adị.
Gaa n’ebe a kpọrọ Ọmụmụ Ihe Ndịàmà Jehova ka ị chọta Ụlọ Nzukọ Alaeze dị gị nso.
Isiokwu na Vidio Ndị Dị n’Ịntanet
Ọtụtụ isiokwu na vidio ndị dị n’ebe a anyị na-edebe ihe n’Ịntanet ga-enyere gị aka ịmatakwu banyere ihe Jizọs kụziri nakwa uru àjà o ji ndụ ya chụọ baara anyị.
Dị ka ihe atụ, gụọ isiokwu bụ́ “Olee Otú Jizọs Si Azọpụta Anyị?” nakwa isiokwu bụ́ “Gịnị Mere Jizọs Ji Taa Ahụhụ ma Nwụọ?” ka ị mata otú ọnwụ otu onye si abara nde kwuru nde mmadụ uru. I nwekwara ike ile vidio isiokwu ya bụ Gịnị Mere Jizọs Ji Nwụọ?