ABỤ NKE 100
Na-anabata Ha nke Ọma
-
1. Jehova Chineke n’anabat’anyị.
Ọ n’elekọt’anyị, n’emesapụa-ka.
Ọ n’enyea-nyị niile
’mir’ozuzo n’anwụ,
N’eme k’anyị nween-ri, nweekw’ọṅụ.
Anyị n’eṅomi ya, n’emesapụa-ka,
Ọ n’egosi n’anyị b’ụmụ Chineke.
Anyị n’em’ebere,
Jehova g’ahụ ya.
Ọ g’agọzikw’anyị n’ihi ya.
-
2. Ị hụn-dị nọ nám-kpa ma nyere h’aka,
Ih’ọ g’arụpụta g’atụ gị n’anya.
Ha nwer’ike ịbụ
ndịa-nyị n’amaghị.
M’anyị n’egboro ha mkpa ha.
K’anyị kwuo ka Lidia: ‘Batanụ n’ụlọm.’
Anyị na ha nọrọ, ahụ́e-ruo h’ala.
Jehova n’ahụa-nyị
m’anyị n’eṅomi ya,
M’anyị n’emere ha ebere.
(Gụọkwa Ọrụ 16:14, 15; Rom 12:13; 1 Tim. 3:2; Hib. 13:2; 1 Pita 4:9.)