Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Na-eme n’Ụwa

Ihe Ndị Na-eme n’Ụwa

Amerịka

Otu akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta n’Amerịka kwuru na ihe onye onye na-aṅụ sịga na-arụrụ ọrụ na-emefu n’isi ya kwa afọ bụ ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ otu narị puku naịra. Nchọpụta e mere n’otu mahadum dị n’obodo ahụ gosiri na otú e si emefu ego ahụ bụ mgbe onye ahụ hapụrụ ọrụ ya gawa ise sịga, ego a na-akwụ ma ọ gaa ịgwọ ọrịa sịga kpataara ya nakwa oge ọ na-abịaghị ọrụ. Onye ahụ agaghị na-arụ ọrụ otú o kwesịrị. Ọ bụrụ na ọ chọọ ịkwụsị ise sịga, ọrịa ọ ga-akpatara ya nwekwara ike ime ka ọ kwụsị ọrụ ọtụtụ ụbọchị.

Ịtali

Poopu Francis sịrị na ndị ụka na ndị isi ha bụ soro okwu ọnụ m esola omume m. Otú a ha si akpa àgwà na-eme ka obi ndị mmadụ ghara ịdị n’ụka.

Maleshia

Ndị uwe ojii Maleshia jidere ụgbọ mmiri abụọ si Togo buru osisi na-aga Chaịna. Ihe mere ha ji jide ha bụ na e zoro ọdụ́ enyí n’ụgbọ ndị ahụ. Ọdụ́ enyí ahụ karịrị otu puku. Ndị ọkachamara kwuru na e nwetụbeghị mgbe e jidere ụgbọ mmiri bu ọdụ́ enyí hiri nne ka ndị ahụ ndị Maleshia jidere.

Afrịka

N’afọ 2012, Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike kwuru na ọtụtụ mmadụ nwụrụ n’Afrịka n’afọ ole na ole na-adịbeghị anya. Ihe gburu ọtụtụ n’ime ha bụ ọrịa o biri n’ájá ọcha, afọ ọsịsa, ịba, ụkwara nta, na ọrịa ndị ọzọ na-arịa ụmụaka.

Ọstrelia

Ọtụtụ ụmụaka Ọstrelia na-eji ihe a rụnyere n’ekwentị ha agba chaa chaa. Ihe ndị ahụ yiri ezigbote ihe e ji agba chaa chaa. Naanị ihe ha ji dị iche bụ na ha na-adị mfe nrite. Otú ịgba ụdị chaa chaa a si dị njọ mere ndị ọchịchị ji kwuo na e kwesịghị ikwe ka ụmụaka na-agba ya n’ihi na ọ ga-eme ka ịgba chaa chaa rie ha ahụ́ ma ha too.