Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

TETA! Nke 2 n'Afọ 2019 | Ihe Isii Ụmụaka Kwesịrị Ịmụta

Ihe Isii Ụmụaka Kwesịrị Ịmụta

Nwa gị too, olee ụdị onye ị ga-achọ ka ọ bụrụ?

  • Onye na-ejide onwe ya

  • Onye dị umeala n’obi

  • Onye na-edi ihe

  • Onye a ga-atụkwasịli obi

  • Onye na-akpa àgwà ka dimkpa

  • Onye na-ekwu eziokwu

Ụmụaka agaghị amụta ihe ndị a n’onwe ha. Ọ bụ gị ga-akụziri ha ya.

N’akwụkwọ a, anyị ga-ekwu banyere ihe isii i kwesịrị ịkụziri ụmụ gị. Ihe ndị ahụ ga-enyere ha aka ma ha too.

 

Uru Mmadụ Ijide Onwe Ya Bara

Gịnị mere mmadụ ijide onwe ya ji dị mkpa, oleekwa otú anyị ga-esi mụta ya?

Kụziere Nwa Gị Ịdị Umeala n’Obi

Ị kụziere nwa gị ịdị umeala n’obi, ọ ga-abara ya uru ma ugbu a ma n’ọdịnihu.

Kụziere Nwa Gị Ịna-edi Ihe

Ụmụaka ndị mụtara ịna-edi ihe na-aka emeri nsogbu ndị ha na ndụ so aga.

Kụziere Nwa Gị Ịbụ Onye A ga-atụkwasịli Obi

Ọ̀ bụ mgbe nwatakịrị dị afọ ole ka e kwesịrị ịkụziri ya otú ọ ga-esi bụrụ onye a ga-atụkwasịli obi, ọ̀ bụ mgbe ọ bụ nwata ka ọ̀ bụ mgbe o toro?

Uru Onye Toro Eto Ịkụziri Nwatakịrị Ihe Bara

E kwesịrị inwe onye ga na-eduzi ụmụaka. Ma, olee onye ga-eme ya?

Ụmụaka Kwesịrị Ịmụta Ịna-akpa Àgwà Ọma

Ịkụziri ụmụaka ịkpa àgwà ọma ga-abara ha uru n’ọdịnihu.

Ihe Ndị Ọzọ Ga-enyere Ndị Nne na Nna Aka

Ndị nne na nna kwesịkwara ịmụta ihe ndị ga-enyere ha aka ịna-ebi ndụ dị mma. Ị chọọ ịmatakwu banyere ya, gaa na jw.org/ig.