IHE NKE 3
Kụziere Nwa Gị Ịna-edi Ihe
GỊNỊ KA MMADỤ IDI IHE PỤTARA?
Ọ naghị esiri onye na-edi ihe ike inwetaghachi onwe ya ma o nwee nsogbu. Mmadụ na-esi n’ihe ndị mere ya amụta àgwà a. Otú ahụ nwatakịrị na-ada ada mgbe ụfọdụ tupu ya amụta ịga ije, ka onye ahụ ga-enwekwa nsogbu mgbe ụfọdụ tupu ihe agaara ya nke ọma ná ndụ.
GỊNỊ MERE IDI IHE JI DỊ MKPA?
Ụmụaka ụfọdụ na-ada mbà n’obi ma ihe siere ha ike, ma ihe ha na-eme agaghị nke ọma, ma ọ bụ ma mmadụ nye ha ndụmọdụ n’ihe ahụ. Ndị ọzọ na-ahapụdị ihe ahụ kpamkpam. Ma, ha kwesịrị ịghọta na:
-
Ọ bụghị mgbe niile ka ihe mmadụ na-eme na-aga nke ọma.—Jems 3:2.
-
O nweghị onye na-agaghị enwe nsogbu mgbe ụfọdụ ná ndụ ya. —Ekliziastis 9:11.
-
Ihe ga-eme ka mmadụ na-emekwu nke ọma bụ ma a na-agwa ya ebe ndị ọ na-anaghị emeta. —Ilu 9:9.
Nwa gị mụta ịna-edi ihe, ọ ga-enyere ya aka ịma na ọ ga-emerili nsogbu ndị ga-abịara ya.
OTÚ Ị GA-ESI AKỤZIRI NWA GỊ ỊNA-EDI IHE
Mgbe nwa gị na-emeghị nke ọma.
IHE BAỊBỤL KWURU: “Onye ezi omume nwere ike ịda ọbụna ugboro asaa, ma ọ ga-ebilicha.” —Ilu 24:16.
Nyere ya aka ịma ihe ọ ga-eme ka ọ ghara inwe nsogbu ahụ o nweburu. Dị ka ihe atụ, gịnị ka ọ ga-eme ma ọ daa ule n’ụlọ akwụkwọ? O nwere ike ịda mbà n’obi, chee na o nweghịzi ihe ọ dị mma ya.
Nyere nwa gị aka ịmata ụzọ ọ ga-esi mewe nke ọma. Ọ ga-eme ka ọ gbalịwa imezi ihe ahụ o mehiere, kama ịnọ na-enwe mwute.
Ma, ejikwala aka gị emeziri ya ihe o mehiere. Kama, nyere ya aka ka ọ chọta ụzọ ọ ga-esi mezie ya n’onwe ya. I nwere ike ịjụ ya, sị: “Olee ihe ị ga-eme ka ị na-aghọtakwu ihe a na-akụziri unu n’ụlọ akwụkwọ?”
Mgbe nsogbu bịara.
IHE BAỊBỤL KWURU: “Unu amaghị ihe ndụ unu ga-abụ echi.”—Jems 4:14.
O nweghị onye ma otú ihe ga-adịrị ya echi. Onye bụ́ aka ji akụ̀ taa nwere ike ịda ogbenye echi. Ekliziastis 9:11.
Onye ahụ́ dị taa nwere ịke ịda ọrịa echi. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ na-emeri n’ọsọ, ọ bụghịkwa ndị dị ike na-emeri n’agha; n’ihi na oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya na-abịakwasị ha niile.”—O doro anya na ị na-agbalị ichebe nwa gị ka ọ ghara ịba ná nsogbu. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị nsogbu niile ka ị ga-echebeli nwa gị na ya.
Ebe ọ bụ na nwa gị etorubeghị ịrụwa ọrụ, nsogbu ọ ga-enwe nwere ike ọ gaghị abụ na a chụrụ ya n’ọrụ ma ọ bụkwa na ụkọ ego ji ya n’olu. Ma, e nwere nsogbu ndị ọzọ i nwere ike inyere ya aka ka o die, dị ka, mgbe ya na enyi ya sere okwu, ma ọ bụ ọnwụ onye ezinụlọ unu. *
Mgbe e nyere nwa gị ndụmọdụ.
IHE BAỊBỤL KWURU: “Nụrụ ndụmọdụ . . . ka i wee mara ihe n’ọdịnihu gị.”—Ilu 19:20.
Mmadụ nye nwa gị ndụmọdụ, ọ pụtaghị na ọ kpọrọ ya asị. Kama, ọ chọrọ inyere ya aka ka o mezie ihe ọ na-anaghị emeta.
Ị kụziere nwa gị ịnabata ndụmọdụ, ọ ga-abara gị na ya uru. Otu nwoke aha ya bụ John nke nwere ezinụlọ kwuru, sị: “Ọ bụrụ na a na-ahapụ ụmụaka mgbe ọ bụla ha mejọrọ ihe, ha agaghị amụta ihe. Ha ga na-esi n’otu nsogbu abanye n’ọzọ. Ọrụ gị ga-abụkwa ịna-agbatara ha ọsọ enyemaka mgbe ọ bụla ha banyere ná nsogbu. Ihe a ga-eme ka ndụ ghara ịna-atọ nne na nna na nwa ha ụtọ.”
Olee otú ị ga-esi nyere nwa gị aka ịna-anabata ndụmọdụ? Mgbe ọ bụla e nyere nwa gị ndụmọdụ, ma ọ̀ bụ n’ụlọ akwụkwọ ma ọ̀ bụ n’ebe ọzọ, ekwukwala na ndụmọdụ ahụ ezighị ezi. Kama ime otú ahụ, jụọ ya, sị:
-
“Olee ihe i chere mere e ji nye gị ndụmọdụ a?”
-
“Olee otú ị ga-esi mezikwuo ihe?”
-
“Olee ihe ị ga-eme mgbe ọzọ ụdị ihe a mere?”
Cheta na ndụmọdụ ga-abara nwa gị uru ugbu a nakwa ma o too.
^ par. 21 Gụọ isiokwu bụ́ “Nyere Nwa Gị Aka Idi Ọnwụ Onye Ọ Hụrụ n’Anya.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Julaị 1, 2008.