Mgbe Di ma ọ bụ Nwunye Gị Gbara n’Èzí
Ọ BỤRỤ na di ma ọ bụ nwunye mmadụ agbaa n’èzí, ọ na-agbawa obi. Ma, ụfọdụ di ma ọ bụ nwunye na-ekpebi ịgbaghara ibe ha ma gbalịa ka ha dịghachikwa ná mma. a Mana, ma di na nwunye hà tisara ma ọ bụ na ha lụụrụ na-aga, ụdị mwute ndị chọpụtara na di ma ọ bụ nwunye ha gbara n’èzí na-enwe anaghị apụ n’obi ngwa ngwa. Gịnị nwere ike inyere ndị ụdị ihe a mere aka?
AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ NWERE IKE INYERE GỊ AKA
Ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ akasiela ọtụtụ ndị di ma ọ bụ nwunye ha gbara n’èzí obi n’agbanyeghị na obi gbawara ha na mbụ. Ha achọpụtala na Chineke na-ahụ anya mmiri ha nakwa na ihe banyere ha na-emetụ ya n’obi.—Malakaị 2:13-16.
“Mgbe m nwere ọtụtụ nchegbu n’ime obi m, nkasi obi gị malitere ime ka ahụ́ ruo mkpụrụ obi m ala.”—Abụ Ọma 94:19.
Bill kwuru, sị: “Ka m nọ na-agụ amaokwu Baịbụl ahụ, eji m uche m na-ahụ otú Jehova si jiri nwayọọ na-eme ka ahụ́ ruo m ala, otú ahụ nna ihe gbasara nwa ya na-emetụ n’obi si eme.”
“Onye na-eguzosi ike n’ihe ka ị ga-eji iguzosi ike n’ihe meso ihe”—Abụ Ọma 18:25.
E nwere otu nwaanyị di ya gbara n’èzí ruo ọtụtụ ọnwa. Aha ya bụ Carmen. O kwuru, sị: “Di m na-agba n’èzí. Ma, obi siri m ike na Jehova agaghị ahapụ m. O nweghị mgbe ọ ga-agharịpụ m.”
“Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe niile, jirinụ ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike . . . mee ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi unu . . . nche.”—Ndị Filipaị 4:6, 7.
Otu nwaanyị aha ya bụ Sasha kwuru, sị: “M gụrụ amaokwu Baịbụl ndị a ọtụtụ ugboro. Ka m na-ekpekwu ekpere, Chineke mere ka obi ruo m ala.”
O nwere mgbe ike ụwa gwụrụ ndị e kwuru gbasara ha n’isiokwu a. Ma, ha tụkwasịrị Jehova Chineke obi, mụọkwa Baịbụl, ya emee ka ha nwee ume. Bill kwuru, sị: “Okwukwe m mere ka ndụ m nwee isi mgbe o yiri ka ihe niile aghasaala. Ọ bụ eziokwu na e nwere mgbe ‘m jere ije na ndagwurugwu gbara oké ọchịchịrị,’ Chineke nọnyeere m.”—Abụ Ọma 23:4.
a Ị chọọ ịhụ ebe a kọwara ihe ga-enyere gị aka ikpebi ma ị̀ ga-agbaghara ka ọ bụ na ị gaghị agbaghara, gụọ isiokwu bụ́, “Mgbe Onye Òtù Ọlụlụ Na-ekwesịghị Ntụkwasị Obi.” Ọ gbara na Teta! Mee 8, 1999.