Jehova Na-enye Anyị Ohere Ikpebi Ihe Anyị Ga-eme
Bịaruo Chineke Nso
Jehova Na-enye Anyị Ohere Ikpebi Ihe Anyị Ga-eme
“ỌTỤTỤ mgbe, m na-atụ ụjọ na-enweghị isi na m ga-emebi mmekọrịta mụ na Jehova.” Nke a bụ ihe otu nwaanyị Onye Kraịst nke chere na ya agaghị ekwesịli ntụkwasị obi n’ihi ihe ọjọọ ndị mere ya mgbe ọ bụ nwata kwuru. Nke a ọ̀ bụ eziokwu? Ọ̀ pụtara na ọ dịghị anyị n’aka ikpebi ma ànyị ga-ekwesị ntụkwasị obi ma ọ bụ na anyị agaghị ekwesị? Mba. Jehova Chineke nyere anyị onyinye ime nhọrọ, ka anyị nwee ike iji aka anyị họrọ otú anyị ga-esi ebi ndụ. Jehova chọrọ ka anyị họrọ ime ihe ziri ezi, Okwu ya, bụ́ Baịbụl, gwakwara anyị otú anyị nwere ike isi mee ya. Ka anyị tụlee ihe Mozis kwuru, nke e dere na Diuterọnọmi isi 30.
Ò siri ike ịmata ihe Chineke chọrọ anyị n’aka na ime ya eme? * Mozis kwuru, sị: “Iwu a m na-enye gị taa esighịrị gị oké ike, ọ dịghịkwa n’ebe dị anya.” (Amaokwu 11) Jehova anaghị agwa anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli. Ihe ndị ọ chọrọ anyị n’aka esighị oké ike, anyị ga-emelikwa ha. Anyị ga-amatalikwa ha. Ọ dịghị anyị mkpa ịrịgoro “n’eluigwe” ma ọ bụ ịga “n’ofe oké osimiri” iji mụta ihe Chineke chọrọ anyị n’aka. (Amaokwu 12, 13) Baịbụl gwara anyị hoo haa otú anyị kwesịrị isi bie ndụ.—Maịka 6:8.
Ma, Jehova anaghị amanye anyị amanye irubere ya isi. Mozis kwuru, sị: “Ana m edebe n’ihu gị taa ndụ na ihe ọma, nakwa ọnwụ na ihe ọjọọ.” (Amaokwu 15) Anyị nweere onwe anyị ịhọrọ ndụ ma ọ bụ ọnwụ, ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ. Anyị nwere ike ịhọrọ ife Chineke na irubere ya isi, ya agọzie anyị, ma ọ bụkwanụ anyị ahọrọ inupụrụ ya isi ma taa ahụhụ ga-esi na ya pụta. Ọ bụ anyị ka ọ dịịrị ịhọrọ nke anyị chọrọ.—Amaokwu 16-18; Ndị Galeshia 6:7, 8.
Nke ọ bụla anyị họọrọ ọ̀ gbasara Jehova? Eenụ! Mozis si n’ike mmụọ nsọ Chineke kwuo, sị: ‘Họrọ ndụ.’ (Amaokwu 19) Ma, olee otú anyị ga-esi họrọ ndụ? Mozis kwuru, sị: “Site n’ịhụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya, site n’ige ntị n’olu ya na site n’ịrapara ya n’ahụ́.” (Amaokwu 20) Ọ bụrụ na anyị ahụ Jehova n’anya, anyị ga-achọ ige ya ntị na irubere ya isi ma raparasie ike n’ahụ́ ya, n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị na-ahọrọ ndụ, bụ́ ụzọ kacha mma isi bie ndụ ugbu a nke ga-eme ka anyị nwee olileanya ibi ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ Chineke na-abịanụ.—2 Pita 3:11-13; 1 Jọn 5:3.
Okwu Mozis na-akụziri anyị eziokwu na-emesi obi ike. N’agbanyeghị ihe merela gị n’ụwa ọjọọ a, ị ga-ekpebili ma ị̀ ga-ekwesị ntụkwasị obi ma ọ bụ na ị gaghị ekwesị; ị ga-emelikwa ihe na-atọ Chineke ụtọ. Jehova akwanyerela gị ùgwù site n’inye gị onyinye ime nhọrọ. Ee, i nwere ike ịhọrọ ịhụ Jehova n’anya, ige ya ntị na ikwesị ntụkwasị obi n’ebe ọ nọ. Ọ bụrụ na ị họrọ ime nke a, Jehova ga-agọzi mgbalị gị.
Eziokwu bụ́ na anyị nweere onwe anyị ịhọrọ ịhụ Jehova n’anya na ijere ya ozi kasiri nwaanyị ahụ e kwuru okwu ya ná mmalite obi. O kwuru, sị: “Ahụrụ m Jehova n’anya. Mgbe ụfọdụ, m na-echefu na ihe kacha mkpa bụ na m hụrụ Jehova n’anya. Ya mere, m ga-ekwesịli ntụkwasị obi.” Site n’enyemaka Jehova, ị ga-emelikwa ya.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 5 Gụọ isiokwu bụ́ “Bịaruo Chineke Nso—Gịnị Ka Jehova Chọrọ Anyị n’Aka?” n’Ụlọ Nche nke October 1, 2009.