Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | NDỊ NWỤRỤ ANWỤ HÀ GA-ADỊLI NDỤ ỌZỌ?

Onye Nwụọ, nke Ya Ọ̀ Gaala?

Onye Nwụọ, nke Ya Ọ̀ Gaala?

Ndị nwụrụ anwụ hà ga-adị ndụ ọzọ?

IHE BAỊBỤL ZARA: “Oge awa na-abịa mgbe ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu [Jizọs] wee pụta.”Jọn 5:28, 29.

Ihe a Jizọs kwuru gosiri na n’ọdịnihu, mgbe ọ ga na-achị n’Alaeze ya, ndị niile nọ n’ili ncheta ga-apụta. Fernando anyị kwuru gbasara ya n’isiokwu bú nke a ụzọ, kwuru, sị: “Mgbe mbụ m gụrụ ihe e dere na Jọn 5:28, 29, o juru m anya. O mere ka m nwee olileanya ma na-atụsi anya ike ịhụ mgbe ọ ga-eme.”

N’oge ochie, Job, bụ́ onye ezi omume, tụrụ anya na ya nwụọ, Chineke ga-akpọlite ya. Job jụrụ, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ pụrụ ịdị ndụ ọzọ?” Ọ zakwara ajụjụ a otú gosiri na o nweghị obi abụọ. Ọ sịrị: “M ga-echere ruo ogologo oge niile a manyere m ichere [n’ili], ruo mgbe a ga-eme ka m nwere onwe m. Ị ga-akpọ òkù, mụ onwe m ga-azakwa gị.”—Job 14:14, 15.

Mkpọlite a kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ mere ka anyị nwee olileanya

Mata nwanne Lazarọs ma na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Mgbe Lazarọs nwụrụ, Jizọs gwara Mata, sị: “Nwanne gị nwoke ga-ebili.” Mata wee sị ya: “Amaara m na ọ ga-ebili n’oge mbilite n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.” Jizọs gwaziri ya, sị: “Abụ m mbilite n’ọnwụ na ndụ. Onye nwere okwukwe n’ebe m nọ, ọ bụrụgodị na ọ nwụọ, ọ ga-adị ndụ ọzọ.” (Jọn 11:23-25) Jizọs kpọliteziri Lazarọs n’ọnwụ. Ihe a Jizọs mere enweghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere nke ọ ga-eme n’ọdịnihu. Chegodị otú ọ ga-adị gị mgbe Jizọs ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ụwa niile.

È nwere ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ, ha agaa eluigwe?

IHE BAỊBỤL ZARA: Okwu Chineke gwara anyị ihe gosiri na mbilite n’ọnwụ Jizọs dị iche na nke mmadụ asatọ ndị ọzọ a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. A kpọlitere mmadụ asatọ ndị ahụ, ha adịrị ndụ n’ụwa. Ma, mgbe a kpọlitechara Jizọs, Baịbụl kwuru na “Jizọs Kraịst . . . nọ n’aka nri Chineke, n’ihi na ọ gara eluigwe.” (1 Pita 3:21, 22) E wezụga Jizọs, è nwere ndị ọzọ a ga-akpọlite n’ọnwụ, ha agaa eluigwe? Jizọs ebula ụzọ gwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụrụkwa na mụ agaa kwadebere unu ebe, m ga-abịa ọzọ, mụ onwe m ga-anabatakwa unu n’ebe obibi m, ka unu wee nọrọkwa n’ebe m nọ.”—Jọn 14:3.

Kraịst laghachiri eluigwe ma kwadebe maka ndị na-eso ụzọ ya ga-aga eluigwe. Ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ, ha agaa eluigwe, ga-adị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ. (Mkpughe 14:1, 3) Ma, olee ihe ha na-aga ime n’eluigwe?

E nwere ọtụtụ ihe ha ga na-arụ. Akwụkwọ Nsọ gwara anyị, sị: “Onye obi ụtọ na onye dị nsọ ka onye ọ bụla nke nwere òkè ná mbilite n’ọnwụ mbụ bụ; ọnwụ nke abụọ enweghị ikike n’ebe ndị a nọ, kama ha ga-abụ ndị nchụàjà nke Chineke na nke Kraịst, ha ga-esokwa ya chịa dị ka ndị eze ruo otu puku afọ.” (Mkpughe 20:6) Ndị ahụ a ga-akpọlite n’ọnwụ, ha agaa eluigwe, ga-eso Kraịst chịa ụwa dị ka ndị eze na ndị nchụàjà.

Olee ndị ọzọ a ga-emecha kpọlite n’ọnwụ?

IHE BAỊBỤL ZARA: Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ kwuo, sị: “Enwekwara m olileanya n’ebe Chineke nọ, bụ́ olileanya nke ndị a n’onwe ha nwekwara, na a gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.”Ọrụ Ndịozi 24:15.

Okwu Chineke mere ka obi sie anyị ike na ọtụtụ ijeri ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ

Olee ndị ga-eso ná ndị Pọl kpọrọ “ndị ezi omume”? Obere oge tupu Daniel, bụ́ onye ezi omume, anwụọ, a gwara ya, sị: “Ị ga-ezukwa ike, ma ị ga-ebili ka i nweta òkè gị mgbe ụbọchị ndị a gwụchara.” (Daniel 12:13) Ebee ka Daniel ga-anọ ma ya si n’ụra ọnwụ bilie? Baịbụl kwuru, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29) Jizọs kwukwara, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi, n’ihi na ha ga-eketa ụwa.” (Matiu 5:5) A ga-akpọlite ma Daniel ma ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị ọzọ fere Chineke, ha adịrịghachi ndụ n’ụwa, dịrịzie ndụ na-aga ruo mgbe ebighị ebi.

Olee ndị bụ “ndị ajọ omume” Pọl kwuru na a ga-akpọlite n’ọnwụ? Ha bụ ọtụtụ ijeri mmadụ ndị nwụrụlanụ. Ọtụtụ n’ime ha enwelighị ike ịmata eziokwu ndị dị na Baịbụl, ha emeghịkwa ihe Baịbụl kwuru. A kpọlitechaa ha n’ọnwụ, ha ga-amụtazi gbasara Jehova * na Jizọs. (Jọn 17:3) Ndị niile họọrọ ife Chineke ga-enwe olileanya ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi ka Jehova.

Ndị niile họọrọ ife Chineke ga-enwe olileanya ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, ha agaghị na-arịa ọrịa, ha ga na-enwekwa obi ụtọ

Olee otú ihe ga-adị n’ụwa ma a kpọlitechaa ndị nwụrụ anwụ?

IHE BAỊBỤL ZARA: Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.” (Mkpughe 21:4) “Ha ga-ewu ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akọkwa ubi vaịn, rie mkpụrụ ha.”—Aịzaya 65:21.

Chegodị otú obi ga-adị gị ma gị na ndị ị hụrụ n’anya e si n’ọnwụ kpọlite biri n’ụwa mgbe ahụ. Ma ajụjụ bụ, Olee ihe ga-eme ka obi sie gị ike na ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ?

^ para. 15 Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.