ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | Ị GA-AGHỌTALI IHE BAỊBỤL NA-EKWU
Akwụkwọ A Ga-aghọtali Aghọta
O teela e dere Baịbụl. Ma, olee mgbe e bidoro ide ya? E bidoro ide ya n’Izrel oge ochie n’ihe dị ka puku afọ atọ na narị afọ ise gara aga. Ọ bụ oge alaeze Shang na-achị n’obodo Chaịna. Ọ bụkwa n’ihe dị ka otu puku afọ tupu okpukpe Buda amalite n’India.—Gụọ ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ “ Ihe Ndị I Kwesịrị Ịma Gbasara Baịbụl.”
Baịbụl zara ajụjụ ndị kacha echu ụmụ mmadụ ụra
Akwụkwọ mmadụ ga-agụ ya abaara ya uru bụ akwụkwọ a na-aghọta nke ọma nakwa nke ihe ọ na-ekwu ga-enyere mmadụ aka ná ndụ. Baịbụl bụ ụdị akwụkwọ ahụ. Ọ zara ajụjụ ndị kacha echu ụmụ mmadụ ụra.
Dị ka ihe atụ, ò nwetụla mgbe ị jụrụ, sị, ‘Gịnị mere anyị ji nọrọ n’ụwa a?’ Kemgbe ụwa, ndị mmadụ na-achọ ịma azịza ajụjụ a. Ma, azịza ya dị n’isi nke mbụ na nke abụọ na Jenesis bụ́ akwụkwọ nke mbụ na Baịbụl. N’ebe ahụ, Baịbụl kọrọ otú ihe niile si bido ọtụtụ ijeri afọ gara aga. O kwuru mgbe e kere eluigwe na ụwa, nakwa kpakpando na ụyọkọ ha dị́ iche iche. (Jenesis 1:1) Ọ kọziri otú ụwa si jiri nwayọọ nwayọọ ghọọ ebe a ga-ebi ebi, otú ụmụ mmadụ na ihe dị́ iche iche dị́ ndụ si malite ịdị, na ihe mere e ji kee ha niile.
E DERE YA OTÚ Ọ GA-ADỊ MFE NGHỌTA
Baịbụl na-agwa anyị ihe ndị anyị ga-eme gbasara nsogbu ndị na-abịara anyị kwa ụbọchị. Ihe ndị ọ na-agwa anyị dịkwa mfe nghọta. Lee ihe abụọ mere o ji dị mfe nghọta.
Nke mbụ bụ na e dere Baịbụl otú ọ ga-edo anya, ruokwa ndị mmadụ n’obi. E jighị okwu ndị dị́ omimi dee ya, kama, e ji okwu ndị doro anya, anyị maara nke ọma, dee ya. E ji ihe ndị anyị na-ahụ kwa ụbọchị kọwaa ihe ndị gaara esi ike nghọta.
Dị ka ihe atụ, Jizọs ji ọtụtụ ihe atụ ndị dị́ mfe nghọta na ihe ndị mmadụ na-eme kwa ụbọchị kụzie ihe, ya eruo ndị mmadụ n’obi. Ọ bụ mgbe ọ na-akụzi ihe n’elu ugwu ka o mere ọtụtụ ihe atụ ndị ahụ. E dekọrọ ha n’akwụkwọ Matiu isi nke 5 ruo isi nke 7. Otu onye gụrụ ihe ndị ahụ Jizọs kwuru n’elu ugwu kwuru na ha “bara ezigbo uru” nakwa na o kwughị ha “iji kọjuo anyị isi, kama, o kwuru ha iji nyere anyị aka ịmụta ịna-akpa àgwà ọma.” O nwere ike iwe gị ihe dị ka nkeji iri na ise ma ọ bụ iri abụọ iji gụchaa ihe ahụ niile Jizọs kụziri n’elu ugwu. Ma, ọ ga-eju gị anya na ihe niile ahụ dị mfe nghọta, baakwa ezigbo uru.
Ihe ọzọ mere Baịbụl ji dị́ mfe nghọta bụ ụdị ihe ndị e dere na ya. Baịbụl abụghị akwụkwọ akụkọ ifo. Kama, dị ka akwụkwọ a na-akpọ The World Book Encyclopedia si kwuo, ihe kacha dịrị na ya bụ “akụkọ gbasara ụmụ mmadụ, ma ndị ukwu ma ndị nta, otú ha si gbaa mbọ, ihe ndị ha tụrụ anya ha, ebe ndị ha mejọrọ ihe na ebe ndị ha meziri.” Ebe ọ bụ akụkọ ụmụ mmadụ ka a kọrọ na ya, ọ dịịrị anyị mfe ịghọta akụkọ ndị ahụ na ịmụta ihe na ha.—MMADỤ NIILE NWERE IKE INWETA YA
Ihe ga-eme ka ị ghọta ihe e dere n’akwụkwọ bụ ma ọ bụrụ na e dere ya n’asụsụ ị maara nke ọma. N’agbanyeghị ebe i bi ma ọ bụ obodo i si, o nwere ike ịbụ na e nweela Baịbụl n’asụsụ ị ga-aghọtali. Ka anyị lee ihe mere e ji nwee ike inwe Baịbụl n’ọtụtụ asụsụ.
Nsụgharị ya. Asụsụ ndị mbụ e ji dee Baịbụl bụ Hibru, Arameik, na Grik. O mere ka ọ bụrụ naanị mmadụ ole na ole ma asụsụ ndị a ga-agụli Baịbụl. Ma, ndị sụgharịrị Baịbụl gbara ezigbo mbọ ka ọ dịrị n’ọtụtụ asụsụ ndị ọzọ. Ọ bụ ya mere e ji nwee Baịbụl, ma ndị nke zuru ezu ma ndị nke na-ezughị ezu, n’ihe dị ka puku asụsụ abụọ na narị asaa. Ọ pụtara na e kee mmadụ niile bí n’ụwa ụzọ iri, ihe karịrị ụzọ itoolu nwere ike ịgụ, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ebe ụfọdụ na Baịbụl n’asụsụ ha.
Mbipụta ya. N’oge e dere Baịbụl, e dere ya n’ihe nwere ike imebi emebi, dị ka n’akpụkpọ anụ nakwa na papaịrọs. Iji mee ka ọtụtụ ndị nweta ya, a na-eji aka, leziekwa anya, na-edepụtaghachi ihe ndị e dere na ya. Ndị nke a e depụtaghachiri na-adị ezigbo ọnụ, ọ bụkwa mmadụ ole na ole na-azụtali ya. Ma mgbe Gutenberg mepụtara ígwè na-ebi akwụkwọ n’ihe karịrị narị afọ ise na iri afọ ise gara aga, e bipụtara ọtụtụ Baịbụl ma kesaakwa ha. Otu nchọpụta e mere gosiri na e kesaala ihe karịrị ijeri Baịbụl ise, ma ndị nke zuru ezu ma ndị nke na-ezughị ezu.
Baịbụl bụ akwụkwọ okpukpe a kacha ebipụta ma na-ekesa. O doro anya na Baịbụl bụ akwụkwọ e kwesịrị ịghọta ihe ọ na-ekwu. Ma, o nwere ike ịna-esitụrụ gị ike ịghọta ya. Ọ bụrụ na ọ na-esitụrụ gị ike, e nwere ihe ga-enyere gị aka. Olee ebe ị ga-achọta ya? Oleekwa uru ọ ga-abara gị? Gụọ isiokwu na-eso nke a ka ị mata azịza ajụjụ ndị a.