Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Eme Ememme Ụfọdụ?
Olee otú Ndịàmà Jehova si amata ememme ha kwesịrị ịna-eme?
Ọ bụ ihe Baịbụl kwuru na-enyere Ndịàmà Jehova aka ịmata ememme ha kwesịrị ịna-eme. O nwere ememme ụfọdụ ọ na-edo onye ukwu na onye nta anya na ha na-eme ka mmadụ mee ihe Baịbụl na-akwadoghị. Ndịàmà Jehova anaghị eso eme ụdị ememme ndị ahụ. Ma, a bịa n’ememme ndị nke Baịbụl na-ekwughị ihe ọ bụla gbasara ha, Onyeàmà Jehova nke ọ bụla ga-eji aka ya kpebie ihe ọ ga-eme ‘ka akọnuche ya ghara ịma ya ikpe, ka ọ gharakwa imebi iwu Chineke ma ọ bụ iwu mmadụ.’—Ọrụ Ndịozi 24:16.
Ihe a bụ ụfọdụ ajụjụ na-enyere Ndịàmà Jehova aka ịmata ma hà kwesịrị iso na-eme ememme ndị mmadụ na-eme. a
Baịbụl ọ̀ kwadoro ihe mere e ji eme ememme a?
Ihe Baịbụl kwuru: “Jehova kwukwara, sị: ‘N’ihi ya, sinụ ebe ha nọ pụọ, nọrọkwanụ iche. Unu emetụzila ihe na-adịghị ọcha aka.’”—2 Ndị Kọrịnt 6:15-17.
Ndịàmà Jehova na-eme ihe a Baịbụl kwuru. Ha anaghị eme ihe ọ bụla ga-eme ka ha ghara ịdị ọcha n’anya Chineke, ya bụ, ihe ọ bụla ga-eme ka ha ghara ime ihe Baịbụl kwuru. N’ihi ya, ha anaghị eme ememme ọ bụla e ji ime ihe ndị anyị na-aga ikwu ugbu a mara.
Ememme ndị na-eme ka mmadụ tụkwasị chi ọzọ obi ma ọ bụ fewe chi ahụ ofufe. Jizọs sịrị: “Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka i kwesịrị ife ofufe, ọ bụkwa naanị ya ka i kwesịrị ijere ozi.” (Matiu 4:10) N’ihi ihe a Jizọs kwuru, Ndịàmà Jehova anaghị agba Krismas, ma ọ bụ Ista. Ha anaghịkwa eme ememme Ụbọchị Ndị Ọrụ. Ememme ndị a na-eme ka mmadụ na-efe chi ọzọ, kama ife Jehova, ọ bụ ya mere na ha anaghị eme ha. Ha anaghịkwa eme ememme ndị a na-esonụ.
Kwanzaa. Otu akwụkwọ aha ya bụ Encyclopedia of Black Studies kwuru na ebe e si nweta okwu a “bụ n’okwu Swahili bụ́ matunda ya kwanza. Matunda ya kwanza pụtara ‘mkpụrụ ndị mbụ.’ Okwu a na-egosi na ememme a malitere mgbe ndị Afrịka mere ememme mbụ ha mere maka mkpụrụ mbụ ha ghọtara.” Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ na-ekwu na Kwanzaa abụghị ememme ndị okpukpe, ma akwụkwọ bụ́ Encyclopedia of African Religion ji ya tụnyere ememme ọzọ ndị Afrịka na-eme. N’ememme ahụ, ha na-eji mkpụrụ mbụ ndị ha ghọtara n’ubi “achụrụ chi dị iche iche na ndị nna ha ochie nwụrụ anwụ àjà ekele.” Akwụkwọ ahụ kwukwara, sị: “Ihe ndị a ha na-eme n’ememme a iji kelee ndị nna ha ochie nwụrụ anwụ maka ndụ ha nyere ha bụkwa ihe ndị isi ojii bụ́ ndị Amerịka na-eme mgbe ha na-eme ememme Kwanzaa.”
Ememme A Na-eme n’Ọnwa Septemba ma Ọ Bụ n’Ọnwa Ọktoba. Otu akwụkwọ aha ya bụ Holidays, Festivals, and Celebrations of the World Dictionary kwuru na a na-eme “ememme a iji kwanyere chi ọnwa ùgwù.” Akwụkwọ ọzọ aha ya bụ Religions of the World—A Comprehensive Encyclopedia of Beliefs and Practices kwuru na e mewe ememme a “ụmụ nwaanyị na-akpọrọ chi ọnwa a isi ala.”
Nọruz. Òtù UNESCO kwuru, sị: “Ọ bụ ndị na-ekpe okpukpe Zorastra malitere ememme a. N’oge ochie, ụbọchị ha na-eme ya so n’ụbọchị kacha nsọ n’ụbọchị ndị ha na-ekpe okpukpe a. . . . Akụkọ ndị Zorastra na-akọ kwuru na Mmụọ Oge Oyi chụkpuru Mmụọ Ehihie n’ime ala n’ọnwa ndị oyi na-atụ nakwa na a na-eji ememme a anabata Mmụọ Ehihie n’etiti ehihie n’ụbọchị a a na-emere ya ememme a.”
Shabe Yalda. Otu akwụkwọ aha ya bụ Sufism in the Secret History of Persia kwuru na “a ga-enwerịrị ihe jikọrọ ememme a a na-eme n’oge oyi mgbe chi na-eji ngwa ngwa na ofufe a na-efe chi a na-akpọ Mitra,” nke a sịrị na ọ bụ chi ìhè. E kwukwara na ọ ga-abu na o nwere ihe jikọrọ ememme a na chi anyanwụ ndị Rom na ndị Grik na-efe. b
Tanksgivin. Otú e si eme ememme a yiri otú e si eme Kwanzaa. Ihe ndị a na-eme n’ememme a bụ ihe ndị a na-eme n’ememme owuwe ihe ubi a na-eme n’oge ochie, nke a na-eme iji kwanyere chi dị iche iche ùgwù. Otu akwụkwọ aha ya bụ A Great and Godly Adventure—The Pilgrims and the Myth of the First Thanksgiving kwuru na ka oge na-aga “e webatara ihe ndị a na-eme n’ememme a na chọọchị.”
Ememme ndị hiwere isi na nkwenkwe ụgha ma ọ bụ na chi ihu ọma. Baịbụl kwuru na ndị “na-edozi tebụl maka chi Ihu Ọma” so ná ndị “na-ahapụ Jehova.” (Aịzaya 65:11) Ọ bụ ihe a mere na Ndịàmà Jehova anaghị eme ememme ndị a na-esonụ:
Ivan Kupala. Otu akwụkwọ a na-akpọ The A to Z of Belarus kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị kweere na n’oge a na-eme ememme [Ivan Kupala], a na-enwe ike dị iche iche na-apụtara onwe ha, nakwa na ọ bụ onye obi kara ma ọ bụkwanụ onye nwere ihu ọma nwere ike inweta ike ndị ahụ.” Ọ bụ ndị na-ekpere arụsị na-emebu ememme a n’oge chi na-eji ngwa ngwa n’oge oyi. Ma, otu akwụkwọ aha ya bụ Encyclopedia of Contemporary Russian Culture kwuru na “kemgbe ndị na-ekpere arụsị bara chọọchị, na ndị chọọchị na-agwakọtazi ememme a ndị na-ekpere arụsị na-eme na [ememme e ji akwanyere Jọn Onye Na-eme Baptizim ùgwù].”
Afọ Ọhụrụ (Afọ Ọhụrụ Ndị Chaịna Ma Ọ Bụ Afọ Ọhụrụ Ndị Koria). Otu akwụkwọ aha ya bụ Mooncakes and Hungry Ghosts—Festivals of China kwuru, sị: “Na Chaịna, ndị ezinụlọ, ndị enyi, na ndị ikwu na-agbasi mbọ ike ná mmalite afọ ọ bụla karịa mgbe ọ bụla ọzọ ka ha nwee ihu ọma n’afọ ahụ, ka ha kwanyere ma chi ndị ha na-efe ma ndị mmụọ ùgwù. Ha na-agọkwa ọfọ ka ndị ọzọ nwee ihu ọma n’afọ ahụ.” Ememme afọ ọhụrụ ndị Koria na-eme yikwara nke ndị Chaịna. Akwụkwọ ọzọ aha ya bụ Encyclopedia of New Year’s Holidays Worldwide kwuru na ihe ndị ha na-eme n’ememme ahụ bụ: “ife ndị nna ha ochie nwụrụ anwụ, ịchụ àjà ndị ha ji achụ ajọ mmụọ ma nwee ihu ọma n’afọ ahụ. Ha na-ajụkwa ase iji mata otú ihe ga-adịrị ha n’afọ ahụ ha banyere.”
Ememme ndị a na-eme iji gosi na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ. Baịbụl tara ụkwa jaa ezé na mkpụrụ obi na-anwụ anwụ. (Ezikiel 18:4) N’ihi ya, Ndịàmà Jehova anaghị eme ememme ndị anyị na-aga ikwu gbasara ha ugbu a. Ndị na-eme ha kweere na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ. Ememme ndị ahụ bụ:
Ụbọchị Mkpụrụ Obi Niile (Ụbọchị Ndị Nwụrụ Anwụ). Otu akwụkwọ aha ya bụ New Catholic Encyclopedia kwuru na ihe a bụ ụbọchị “e ji echeta ndị niile nwụrụ anwụ. N’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ ise gara aga, ndị mmadụ malitere ikwere na mkpụrụ obi ndị nọ na pọgatrị na-apụta n’ihu ndị mejọrọ ha mgbe ha nọ ndụ n’ụbọchị ahụ. Ha na-apụta ka ndị mmụọ, ndị amusu, awọ na ihe ndị ọzọ.”
Ememme Chin Min na Ememme A Na-emere Ndị Mmụọ Agụụ Na-agụ. A na-eji ememme abụọ a akwanyere ndị nna ochie nwụrụ anwụ ùgwù. Otu akwụkwọ aha ya bụ Celebrating Life Customs Around the World—From Baby Showers to Funerals Ch’ing Ming kwuru na “a na-agba nri, mmanya, mmiri, na akwụkwọ ego ọkụ n’oge a na-eme ememme ndị a. Ihe mere e ji agba ihe ndị a ọkụ bụ ka agụụ ghara ịgụ ndị nwụrụ anwụ, ka akpịrị ghara ịkpọ ha nkụ nakwa ka ego ghara ịkọ ha.” Akwụkwọ ahụ kwuru na ndị na-eme ememme ahụ kweere na “o nwere ezigbo ihe jikọrọ ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ, karịchaa n’anyasị ahụ ọnwa gbazuru. N’ihi ya, ọ dị mma ilezi anya iji mee ka obi dị ndị nna ochie nwụrụ anwụ na ndị ọzọ nwụrụ anwụ mma.”
Chuseok. Akwụkwọ aha ya bụ The Korean Tradition of Religion, Society, and Ethics kwuru na ihe so n’ihe a na-eme n’ememme a bụ “inye mkpụrụ obi ndị nwụrụ anwụ nri na mmanya.” O kwukwara na ihe e ji enye ha ihe ndị a bụ na ndị na-eme ememme ahụ “kweere na mkpụrụ obi mmadụ na-adịrị ndụ na-aga mgbe ahụ́ onye ahụ nwụrụla.”
Ememme ndị nwere ihe jikọrọ ha na anwansi. Baịbụl sịrị: ‘Onye ọ bụla nke na-agba afa, onye ọ bụla nke na-eme anwansi, onye ọ bụla nke na-agba afa ka ọ mata ihe ga-eme n’ọdịnihu, dibịa anwansi, onye ọ bụla nke na-akọ ndị ọzọ ọgwụ, onye ọ bụla nke na-ajụ onye na-agba afa ma ọ bụ onye na-akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu ase, ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ajụ ndị nwụrụ anwụ ase. . . . Jehova kpọrọ ya asị.’ (Diuterọnọmi 18:10-12) Ndịàmà Jehova anaghị eme ememme Halowin maka na o nweghị ihe gbasara ha na anwansi. Ha anaghịkwa eji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu maka na ọ bụ ime anwasi. Ndịàmà Jehova anaghịkwa eme ememme ndị na-esonụ:
Afọ Ọhụrụ Ndị Sinhala na nke Ndị Tamụl. Otu akwụkwọ aha ya bụ Encyclopedia of Sri Lanka kwuru, sị: “Ihe so n’ihe a na-eme n’ememme a bụ ime ihe ụfọdụ n’oge ndị ji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu kwuru na onye mere ihe ndị ahụ n’oge ahụ ga-enweta ihu ọma.”
Sọnkran. Otu akwụkwọ aha ya bụ Food, Feasts, and Faith—An Encyclopedia of Food Culture in World Religion kwuru na e si n’asụsụ Sanskrit nweta aha ememme a ndị Eshia na-eme nakwa na ọ pụtara ‘ngafe’ ma ọ bụ ‘mgbanwe.’ Akwụkwọ ahụ kwukwara na a na-eme ememme a iji gosi mgbe anyanwụ si ebe ọ nọbụ gafee n’ìgwè kpakpando Aris.
Ememme ndị Iwu Mosis kwuru ka a na-eme, ma àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ kwụsịrị ha. Baịbụl kwuru, sị: “Iwu ahụ kwụsịrị na Kraịst.” (Ndị Rom 10:4) Ihe ndị e kwuru n’Iwu ahụ Chineke si n’aka Mozis nye ndị Izrel oge ochie ka baara Ndị Kraịst uru. Ma, Ndị Kraịst anaghị eme ememme ndị Iwu Mosis kwuru ka a na-eme, karịchaa, ndị nke na-egosi na Mezaya ka ga-abịa n’ọdịnihu. Ha kweere na Mezaya ahụ abịalarị. Baịbụl kwuru na “ihe ndị ahụ nọchiri anya ihe ndị gaje ịbịa, ma onye ihe ndị ahụ ga-emezu n’isi ya bụ Kraịst.” (Ndị Kọlọsi 2:17) N’ihi ihe a anyị kwurula nakwa n’ihi na ndị na-eme ememme ndị ahụ ugbu a na-eme ihe Baịbụl na-akwadoghị, Ndịàmà Jehova anaghị eme ememme ndị a na-esonụ:
Hanụka. A na-eji ememme a echeta mgbe e nyefere Chineke ụlọ nsọ ndị Juu dị na Jeruselem nke ugboro abụọ. Ma, Baịbụl kwuru na Jizọs ghọrọ Nnukwu Onye Nchụàjà “n’ụlọikwuu [ma ọ bụ ụlọ nsọ] ka ukwuu a na-ejighị aka rụọ, nke kakwa zuo okè, ya bụ, nke na-adịghị n’ụwa a.” (Ndị Hibru 9:11) Ndị Kraịst kwetasiri ike na ụlọ nsọ e kwuru okwu ya n’amaokwu a nọchiri ụlọ nsọ ahụ a na-ahụ anya dịbu na Jeruselem.
Rosh Hashana. Ụbọchị a na-eme ememme a bụ ụbọchị mbụ n’afọ ndị Juu. N’oge ochie, a na-achụrụ Chineke àjà pụrụ iche ma a na-eme ememme a. (Ọnụ Ọgụgụ 29:1-6) Ma, Jizọs Kraịst, bụ́ Mezaya, mere “ka a kwụsị ịchụ àjà na inye onyinye.” Otú a ọ kwụsịrị ha mere ka Chineke gharazie ịna-anabata ha.—Daniel 9:26, 27.
Ememme ahụ ọ̀ na-eme ka ndị si n’okpukpe dị iche iche na-efekọ ofufe ọnụ?
Ihe Baịbụl kwuru: ‘Gịnị jikọrọ onye kwere ekwe na onye na-ekweghị ekwe? Gịnị jikọrọ arụsị na ụlọ nsọ Chineke?’—2 Ndị Kọrịnt 6:15-17.
Ndịàmà Jehova na-agbalịsi ike ka ha na ndị agbata obi ha na-ebi n’udo. Ha anaghịkwa atụrụ ndị agbata obi ha ihe ha ga-ekwere n’ihi na ha ma na onye ọ bụla nweere onwe ya ikwere ihe ọ chọrọ ikwere. Ma, ha anaghị eso ha eme ememme ọ bụla na-eme ka ndị si n’okpukpe dị iche iche na-efekọ ofufe ọnụ. Ka anyị kwuo gbasara ụfọdụ n’ime ha.
Ememme e ji akwanyere onye a ma ama n’okpukpe ùgwù ma ọ bụ nke na-eme ka ndị si n’okpukpe dị iche iche na-efekọ ofufe ọnụ. N’oge ochie mgbe Chineke dugara ndị Izrel n’ala ndị bi na ha na-efe chi ụgha dị iche iche, ọ gwara ha, sị: “Unu na ha ma ọ bụ chi ha agbala ndụ. . . . Ọ bụrụ na unu efee chi ha, ọ ga-abụrụ unu ọnyà.” (Ọpụpụ 23:32, 33) N’ihi ya, Ndịàmà Jehova anaghị eso ndị ọzọ eme ememme ndị na-esonụ.
Loy Kratọn. Akwụkwọ aha ya bụ Encyclopedia of Buddhism kwuru na ndị Taịland mewe ememme a “ha na-eji mkpá akwụkwọ arụ ihe yiri efere, tinyekwa kandụl ma ọ bụ insensi a mụnyere ọkụ n’ime ha ma dọnyezie ha ná mmiri ka mmiri buru ha gawa. Ha na-esi otú a egosi na ụgbọ mmiri ebufuola isi ọjọọ ha. Ha na-eji ememme a echeta ndụ dị nsọ Buda biri n’ụwa.”
Ụbọchị Ọhaneze Ji Egosi na Ha Echegharịala. Otu akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta na Papụa Niu Gini aha ya bụ The National kwuru na otu onye ọkwa ya gbagotere n’ọchịchị obodo ahụ kwuru na ndị na-eme ememme a “kweere na ha ga na-akpa àgwà Ndị Kraịst.” O kwukwara na ememme ahụ “na-enye aka eme ka ndị mmadụ na-akpa àgwà Ndị Kraịst.”
Vesak. Otu akwụkwọ aha ya bụ Holidays, Festivals, and Celebrations of the World Dictionary kwuru, sị: “Ụbọchị a na-eme ememme a bụ ụbọchị kacha ụbọchị niile nsọ n’okpukpe ndị Buda. A na-eji ya echeta ụbọchị amụrụ Buda, otú o si nweta amamihe, ọnwụ ya, ma ọ bụ mgbe o nweere onwe ya.”
Ememme ndị na-adịghị na Baịbụl ma ndị okpukpe na-eme ha. Jizọs gwara ndị isi okpukpe, sị: “Unu ejirila ọdịnala unu mee ka okwu Chineke bụrụ ihe efu.” Ọ gwakwara ha na ofufe ha na-efe Chineke bụ n’efu n’ihi na ha na-akụzi “ihe mmadụ nyere n’iwu.” (Matiu 15:6, 9) N’ihi ihe a Jizọs kwuru, Ndịàmà Jehova anaghị eme ememme ndị okpukpe na-eme.
Epifanị ma ọ bụ Ụbọchị Ndị Eze Atọ. E ji ememme a echeta nleta ahụ ndị ji kpakpando akọ ọdịnihu gara leta Jizọs. A na-emekwa ya iji cheta mgbe Jizọs mere baptizim. Otu akwụkwọ aha ya bụ The Christmas Encyclopedia kwuru na “ọ bụ ndị na-ekpere arụsị na-emebu ememme a ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst na-emezi. Ndị na-ekpere arụsị na-eji ya akwanyere chi mmiri dị iche iche ùgwù.” Akwụkwọ ọzọ aha ya bụ Encyclopedia of Society and Culture in the Ancient World kwuru na aha ememme ọzọ yiri ememme a bụ Timkat nakwa na ihe ndị a na-eme n’ememme a “hiwere isi n’omenala.”
Ememme E Ji Echeta Mgbe Vejin Meri Gara Eluigwe. Ndị na-eme ememme na-eme ya iji gosi na obi dị ha ụtọ na nne Jizọs bu anụ ahụ́ gaa eluigwe. Otu akwụkwọ aha ya bụ Religion and Society—Encyclopedia of Fundamentalism kwuru na “Ndị Kraịst oge gboo amaghị gbasara ozizi a nakwa na ọ dịghị n’Akwụkwọ Nsọ.”
Ememme e ji echeta na Meri enweghị njọ. Akwụkwọ aha ya bụ New Catholic Encyclopedia kwuru, sị: “Ozizi a a na-ezi na Meri eketaghị ajọ omume adịghị n’Akwụkwọ Nsọ . . . Ọ bụ ozizi ndị chọọchị chepụtara.”
Lent. Otu akwụkwọ aha ya bụ New Catholic Encyclopedia kwuru na ọ bụ mgbe o merela ihe karịrị narị afọ abụọ e dechara Baịbụl, ya bụ, “n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ ise gara aga” ka a malitere ime ememme a na ihe ndị ha na ya so, ya bụ, ichegharị ná mmehie na ibu ọnụ. Akwụkwọ ahụ kwuru gbasara ụbọchị Lent na-amalite n’afọ ọ bụla, sị: “Kemgbe ndị Katọlik nwechara nnọkọ ha na Benevento n’afọ 1091, ha na-ete ndị òtù ha ntụ n’ụbọchị Ash Wenezdee.”
Meskel (ma ọ bụ, Maskal). Otu akwụkwọ aha ya bụ Encyclopedia of Society and Culture in the Medieval World kwuru na ndị Etiopia na-eji ememme a egosi na ha “na-achọ ezigbo obe, ya bụ, obe ahụ a kpọgburu Kraịst n’elu ya. Ha na-emenwu ọkụ ma na-agba egwú gburugburu ya.” Ma, Ndịàmà Jehova anaghị eji obe eme ihe ọ bụla n’ofufe ha.
È ji ememme ahụ eto mmadụ, òtù, ma ọ bụ ihe e ji mara obodo?
Ihe Baịbụl kwuru: “Jehova kwuru, sị: ‘Onye tụkwasịrị mmadụ nkịtị obi,onye ji ike mmadụ nwee nchekwube, onye obi ya na-adịghịzi n’ebe Jehova nọ, a ga-abụ ya ọnụ.’”—Jeremaya 17:5.
Obi na-adị Ndịàmà Jehova mma maka mbọ ndị mmadụ na-agba. Ha na-etinyekwa ha n’ekpere. Ma, ha anaghị eso ha eme ụdị ememme ndị na-esonụ:
Ememme e ji akwanyere onye ọchịchị ma ọ bụ onye a ma ama ùgwù. Baịbụl kwuru, sị: “Maka ọdịmma unu, unu atụkwasịzila mmadụ nkịtị obi, onye naanị ihe ji ya ndụ bụ ume ọ na-eku. Gịnị mere a ga-eji jiri ya kpọrọ ihe?” (Aịzaya 2:22) N’ihi ya, Ndịàmà Jehova anaghị eso eme ihe dị ka ememme ụbọchị ọmụmụ onye ọchịchị.
Ememme e ji egbuchapụrụ ọkọlọtọ mba. Ndịàmà Jehova anaghị eme ememme e ji egbuchapụrụ ọkọlọtọ. Gịnị mere na anyị anaghị eso eme ya? Ọ bụ maka na Baịbụl kwuru, sị: “Kpacharanụ anya ka unu ghara ikpere arụsị.” (1 Jọn 5:21) Taa, ụfọdụ ndị anaghị ele ọkọlọtọ anya ka arụsị ma ọ bụ ihe a na-efe ofufe. Ma, otu onye na-akọ akụkọ ihe mere eme aha ya bụ Carlton J. H. Hayes dere, sị: “Ọkọlọtọ bụ ihe bụ́ isi e ji amata ndị hụrụ mba ha n’anya, bụrụkwa ihe bụ́ isi ha na-efe ofufe.”
Ememme e ji akwanyere onye sent ùgwù. Gịnị mere mgbe otu nwoke na-atụ egwu Chineke kpọọrọ Pita onyeozi isiala? Baịbụl kwuru, sị: “Pita dọlitere ya, sị ya: ‘Bilie, abụ m mmadụ ibe gị.’” (Ọrụ Ndịozi 10:25, 26) Ebe ọ bụ na Pita na ndịozi ndị ọzọ ekweghị ka a kwanyere ha ùgwù pụrụ iche ma ọ bụkwanụ kwe ka a kpọọrọ ha isiala, Ndịàmà Jehova anaghị eso eme ụdị ememme ndị a na-esonụ e ji akwanyere ndị sent ùgwù:
Ụbọchị Ndị Nsọ Niile. Otu akwụkwọ aha ya bụ New Catholic Encyclopedia kwuru, sị: “Ememme a bụ ememme e ji akwanyere ndị nsọ niile ùgwù. . . Otú ememme a si malite edoghị anya.”
Ememme E Ji Echeta Mgbe A Hụrụ Meri na Guadalup. A na-eji ememme a akwanyere “sent na-echebe Meziko” ùgwù. Ụfọdụ kweere na nwaanyị a a sị na a hụrụ na Meziko bụ Meri, nne Jizọs. Otu akwụkwọ aha ya bụ The Greenwood Encyclopedia of Latino Literature kwuru na otu onye ọrụ ugbo hụrụ nwaanyị a n’afọ 1531.
Ụbọchị Ịgụ Aha. Otu akwụkwọ aha ya bụ Celebrating Life Customs Around the World—From Baby Showers to Funerals kwuru na “Ụbọchị ịgụ aha bụ ụbọchị a na-eme ememme e ji akwanyere onye nwe aha a gụrụ nwatakịrị ụbọchị o mere mmiri chukwu ma ọ bụkwanụ ụbọchị o mere kọnfameshiọn ùgwù.” O kwukwara na “ndị na-eme ememme a bụ ndị ụka.”
Ememme ndị e ji echeta mbọ a gbara ka ihe dị mma n’obodo. Baịbụl sịrị: “Ọ ka mma ịgbaba n’ime Jehova kama ịtụkwasị mmadụ obi.” (Abụ Ọma 118:8, 9) Ndịàmà Jehova anaghị eme ememme Ụbọchị Ndị Ntorobịa ma ọ bụ eme ememme Ụbọchị Ụmụ Nwaanyị. Ihe mere na ha anaghị eme ememme ndị a bụ maka na obi siri ha ike na ọ bụ Chineke ga-akwụsị ihe ndị na-enye anyị nsogbu n’ụwa taa, ọ bụghị mbọ ndị mmadụ na-agba. Ọ bụkwa otu ihe a mere na ha anaghị eme ememme Ụbọchị Nnwere Onwe ma ọ bụ ememme ndị dị ka ya. Kama ịtụkwasị mmadụ obi, ha nwere nchekwube na ọ bụ Alaeze Chineke ga-akwụsị nkewa na ịkpa ókè.—Ndị Rom 2:11; 8:21.
Ememme ahụ ọ̀ na-egosi na mba nke a ma ọ bụ agbụrụ nke a ka ndị nke ọzọ mma?
Ihe Baịbụl kwuru: “Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu. Kama ná mba ọ bụla, ọ na-anabata onye na-atụ egwu ya, nke na-emekwa ihe dị mma.”—Ọrụ Ndịozi 10:34, 35.
Ọ bụ eziokwu na Ndịàmà Jehova akpọghị ala nna ha asị, ma, ha anaghị eme ememme ndị na-egosi na mba ha ma ọ bụ agbụrụ ha ka nke ndị ọzọ mma. Ka anyị leba anya n’ụdị ememme ndị na-egosi na mba mmadụ ma ọ bụ agbụrụ ya ka nke ndị ọzọ mma.
Ememme ndị e ji akwanyere ndị agha ùgwù. Jizọs achọghị ka ndị na-eso ụzọ ya na-alụ agha. Ọ bụ ya mere o ji gwa ha, sị: “Unu akwụsịla ịhụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwanụ ekpere maka ndị na-akpagbu unu.” (Matiu 5:44) N’ihi ya, Ndịàmà Jehova anaghị eme ememme ndị e ji akwanyere ndị agha ùgwù. Ha anaghịkwa eme ememme ndị na-esonụ:
Ụbọchị Anzac. Otu akwụkwọ aha ya bụ Historical Dictionary of Australia kwuru na “Anzac bụ aha a na-akpọ ndị agha ndị Ọstrelia na nke ndị Niu Ziland,” nakwa na “Ụbọchị Anzac ejirila nwayọọ nwayọọ ghọọ ụbọchị a na-echeta ndị e gburu n’agha.”
Ụbọchị Ndị Gara Agha (Ụbọchị Ncheta, ma ọ bụ Sọnde Ncheta). Otu akwụkwọ aha ya bụ Encyclopædia Britannica kwuru na ụbọchị ndị a bụ ụbọchị ndị a na-akwanyere “ndị gara agha na ndị e gburu n’agha obodo” ùgwù.
Ememme e ji echeta ihe ndị mere n’obodo n’oge gara aga ma ọ bụ nke e ji echeta mgbe obodo nweere onwe ya. Jizọs kwuru gbasara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ha abụghị nke ụwa, otú m na-abụghị nke ụwa.” (Jọn 17:16) Ọ bụ eziokwu na Ndịàmà Jehova na-enwe mmasị ịmata ihe ndị mere n’obodo ha n’oge gara aga, ma, ha anaghị eso ndị obodo ha eme ụdị ememme ndị na-esonụ:
Ụbọchị Ọstrelia. Otu akwụkwọ aha ya bụ Worldmark Encyclopedia of Cultures and Daily Life kwuru na a na-eji ụbọchị a echeta “ihe mere n’afọ 1788 mgbe ndị agha Ịngland kwụwara ọkọlọtọ obodo ha n’Ọstrelia iji gosi na obodo ha amalitela ịchị Ọstrelia.”
Ụbọchị Gaị Fọks. Akwụkwọ aha ya bụ A Dictionary of English Folklore kwuru na “ụbọchị a bụ ụbọchị a na-echeta otú mbọ Guy Fawkes na ndị Katọlik ndị ọzọ gbara [n’Ịngland] n’afọ 1605 ka ha memilaa Eze James nke Mbụ na ndị welitere isi n’ọchịchị obodo ahụ si kụọ afọ n’ala.”
Ụbọchị Obodo Nweere Onwe Ha. Akwụkwọ aha ya bụ Merriam-Webster’s Unabridged Dictionary kwuru na n’ọtụtụ obodo, “ụbọchị a bụ ụbọchị a na-echeta ụbọchị obodo ndị ahụ nweere onwe ha.”
Ihe e ji mara ememme ahụ ọ̀ bụ imefe ihe ókè ma ọ bụkwanụ omume ọjọọ?
Ihe Baịbụl kwuru: “N’oge gara aga, unu ji nnukwu oge bie ndụ otú ndị mba ọzọ na-achọ. Mgbe ahụ, ihe ọjọọ na-agụ unu agụụ, unu ana-eme ihe ọjọọ n’asọghị anya, na-aṅụ oké mmanya, na-eme oriri oké mkpọtụ, unu na ibe unu ana-ama aka onye ga-aṅụkarị ibe ya ná mmanya, unu ana-ekpekwara arụsị.”—1 Pita 4:3.
Ihe a amaokwu a kwuru mere ka Ndịàmà Jehova ghara ịna-eme ememme ọ bụla ọ ga-abụ a na-eme ndị mmadụ ana-aṅụ oké mmanya ma ọ bụ na-eme oké mkpọtụ. Ndịàmà Jehova na ndị enyi ha na-anọkọ, nweekwa aṅụrị. Ha chọọkwa, ha na-aṅụtụ mmanya na-aba n’anya. Ma, ha na-agba mbọ ime ihe a Baịbụl kwuru: “Ma ùnu na-eri ihe ma ùnu na-aṅụ ihe ma ùnu na-eme ihe ọ bụla ọzọ, na-emenụ ihe niile otú ga-eme ka e too Chineke.”—1 Ndị Kọrịnt 10:31.
N’ihi ya, Ndịàmà Jehova anaghị eme ememme ọ bụla ọ na-abụ ndị mmadụ na-eme ya, ya afọdụ obere ka ha gbara ọtọ na-agagharị, na-eme omume ọjọọ dị iche iche, bụ́kwanụ ihe Baịbụl sị anyị emela. Purim ndị Juu na-eme so n’ụdị ememme a. Ọ bụ eziokwu na n’oge ochie, e ji ememme Purim na-echeta otú e si napụta ndị Juu n’aka ndị chọrọ igbuchapụ ha n’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ ise gara aga, ma, akwụkwọ aha ya bụ Essential Judaism kwuru na “ndị na-emezi ya ugbu a na-abụ ha na-eme ya, ya afọdụ obere ka ha gbara ọtọ na-agagharị, ha ana-emekwa omume ọjọọ dị iche iche. O kwukwara na “ụmụ nwoke na-eyiri uwe ụmụ nwaanyị, ṅụrọcha anya, na-emekwa ara ara” ma a na-eme ya.
Ndịàmà Jehova hà hụrụ ndị ezinụlọ ha n’anya n’agbanyeghị na ha anaghị eso ha eme ememme ụfọdụ?
Ee. Ha ka hụrụ ha n’anya. Baịbụl gwara anyị ka anyị hụ ndị ezinụlọ anyị niile n’anya ma na-akwanyere ha ùgwù, ma hà bụ Ndịàmà Jehova ma ọ̀ bụ na ha abụghị. (1 Pita 3:1, 2, 7) Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na Onyeàmà Jehova akwụsị iso ndị ikwu ya na-eme ememme ụfọdụ ha na-eme, ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịna-ewere ya iwe ma ọ bụdị chee na ọ na-emechu ha ihu. Ọ bụ ya mere ọtụtụ Ndịàmà Jehova ji eme ka obi sie ndị ikwu ha ike na ha ka hụrụ ha n’anya. Otú ha si eme ya bụ iwetu obi kọwaara ha ihe mere na ha anaghị eme ememme ndị ahụ. Ha na-agakwa na nke ndị ikwu ha n’oge ndị na-abụghị oge a na-eme ememme ndị ahụ.
Ndịàmà Jehova hà na-egbochi ndị mmadụ ime ememme ụfọdụ?
Mba. Ha kweere na onye ọ bụla ga-eji aka ya kpebie ihe ọ ga-eme. (Joshụa 24:15) Ndịàmà Jehova ‘na-asọpụrụ ụdị mmadụ niile,’ n’agbanyeghị okpukpe ha na-ekpe.—1 Pita 2:17.