Baịbụl A Na-egere Egere Ọtụtụ Narị Mmadụ So Gụọ
“Ọ na-eme ka uche mmadụ dịrị n’ihe a na-agụ, meekwa ka onye ahụ chebara ya echiche.”
“Ọ na-eme ka ọ dị onye na-ege ha ka ọ̀ nọ mgbe ihe a na-agụ na-eme.”
“Ọ na-atọ m ka shụga. Ọ na-eme ka m kwetasikwuo ike na ihe ndị m na-agụ na Baịbụl mere eme.”
Ihe ndị a e kwuru bụ ihe ndị gerela akwụkwọ Matiu a na-egere egere kwuru. Ọ dị n’asụsụ Bekee na jw.org.
Ọ bụ n’afọ 1978 ka Ndịàmà Jehova malitere iwepụta Baịbụl a na-egere egere. Ka oge na-aga, a gụrụ akwụkwọ niile dị na Baịbụl n’ozuzu ya ma ọ bụkwanụ akwụkwọ ya ụfọdụ n’asụsụ iri abụọ.
Ihe mere e ji na-agụgharị Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ bụ na e degharịrị Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’afọ 2013. Ná nke ochie ahụ, ọ bụ mmadụ atọ gụrụ ya. Ma, na nke ọhụrụ a, a bịa n’ihe karịrị otu puku mmadụ kwuru okwu na Baịbụl, otu onye na-agụ ihe otu onye kwuru, onye ọzọ agụọ ihe onye ọzọ kwuru.
Ihe mere e ji kpọta ọtụtụ ndị ka ha soro gụọ Baịbụl a bụ na ọ ga-eme ka ọ dị ndị na-ege ya ka hà nọ mgbe ihe a na-agụ na-eme. Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị akụkọ Baịbụl a na-egere ege n’ihi na ị gaghị anụ ụda egwú ma ọ bụ ụda ihe ndị ọzọ na ha, ma a gụrụ ha ka ndị na-ege ha mata na ihe ndị ha na-egere mere eme.
Baịbụl a ọtụtụ ndị so na-agụ chọrọ ka a hazie otú a ga-esi agụ ya ahazie. Tupu a malite ịgụ ya, ndị na-eme nchọpụta ga-achọpụta onye kwuru ihe ahụ a chọrọ ịgụ, ihe ihe ahụ a chọrọ ịgụ pụtara, nakwa otú a ga-esi agụ ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na e nwere ihe onyeozi kwuru n’akụkọ a chọrọ ịgụ, ma a kpọghị onyeozi ahụ aha, ònye kwesịrị ịgụ ya? A bịa n’ebe mmadụ rụrụ ụka, e nwere ike ikwu na onye ahụ bụ Tọmọs, e nwee ebe mmadụ kwuru okwu n’echeghị echiche, e nwere ike ịsị na onye ahụ bụ Pita.
Ihe a na-echebakwara echiche tupu e kenye mmadụ ihe ọ ga-agụ bụ afọ ndụ onye kwuru ihe ahụ na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, a chọọ ịgụ ihe Jọn onyeozi kwuru mgbe ọ bụ okorobịa, onye ga-agụ ihe ndị o kwuru ga-abụkwa nwa okorobịa. A chọọkwanụ ịgụ ihe Jọn onyeozi kwuru mgbe ọ katarala ahụ́, onye ga-agụ ya ga-abụ onye katarala ahụ́.
Ihe ọzọ dị mkpa bụ inweta ndị na-agụ ihe nke ọma. E nwetara ọtụtụ n’ime ha n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị n’Amerịka. Tupu a họpụta ha iso gụọ ihe, a na-enye onye nke ọ bụla n’ime ha otu paragraf dị na Teta! ma gwa ya ka ọ mụọ ya nke ọma. Ọ mụchaa ya, ya abịa gụọ ya n’ihu ndị na-ahụ maka ịgụ ihe ka ha nwee ike ịma ma ò ruru eru iso gụọ ihe. A na-asịkwa ha gụọ ebe e ji iwe kwuo okwu na Baịbụl, ebe onye obi na-adịghị mma kwuru okwu, ebe mmadụ ji obi ụtọ kwuo okwu, nakwa ebe onye dara mbà n’obi kwuru okwu. Ihe ndị ahụ a na-ekenye ha ka ha gụọ na-eme ka a mata ndị na-agụ ihe nke ọma, nakwa ebe ndị ha ga-akacha agụta.
E nye ndị ga-agụ ihe ihe ndị ha ga-agụ, ha na-abịa n’otu n’ime ebe anyị na-etinye ihe na teepụ dị́ na Bruklin, Patasịn, ma ọ bụ na Wọlkil ka e tinye ihe ha ga-agụ na teepụ. Onye na-eduzi ndị na-agụ ihe na-agbalị ịhụ na a gụrụ ha otú e kwesịrị isi agụ ha. Ọ na-ejide akwụkwọ e dere ihe a na-agụ, bụ́ nke kwuru otú e kwesịrị isi akwụsịtụ mgbe a na-agụ ihe nakwa otú e kwesịrị isi emesi okwu ike n’ihe a na-agụ, elere anya. Onye na-agụ ihe na-ejidekwa otu, jiri ya na-agụ ihe. Onye na-eduzi ndị na-agụ ihe ga-elere anya na Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke ochie a gụrụla agụ iji mara ma ndị na-agụ ihe hà gụtara ha.
E nwee ebe ụfọdụ na-adịchaghị mma n’ihe ndị ahụ e tinyere na teepụ, a na-anọ ebe ahụ mezie ha. E nwee ebe onye na-agụ ihe na-agụtachaghị, ọ na-agụgharị ya ugboro ugboro. Ọ gụchaa, a na-ewere okwu ma ọ bụ ahịrị okwu ndị ọ gụtara jikọta ọnụ ka ha bụrụ ịgba.
Anyị amaghị oge ọ ga-ewe iji gụcha ma tinye Baịbụl Nsụghrị Ụwa Ọhụrụ nke afọ 2013 e degharịrị edegharị na teepụ. Ọ bụrụ na a gụchaa otu akwụkwọ dị na Baịbụl, a ga-etinye ya na jw.org, seekwa ihe yiri ihe e ji ege egwú n’akụkụ aha akwụkwọ Baịbụl ahụ a gụcharala. Ha ga-adị n’okpuru ebe e dere “Akwụkwọ Ndị Dị na Baịbụl.”