Gaa n'Isiokwu

Ilegharị Anya n’Ụlọ Ọrụ Ndịàmà Jehova

Obi ga-adị anyị ụtọ ma ị gaa legharịa anya n’ụlọ ọrụ anyị dị iche iche nakwa n’ebe ndị anyị na-ebi akwụkwọ. Ebe a ka ị ga-anọ achọpụta ebe ụlọ ọrụ anyị dị na oge ndị ọbịa ji aga elegharị anya ebe ahụ.

Ịmaliteghachi Ilegharị Anya na Betel: N'ọtụtụ mba, a ga-amaliteghachi ịga legharịwa anya na Betel malite na Jun 1, 2023. Iji matakwuo ihe ndị ọzọ banyere ya, biko kpọturu alaka ụlọ ọrụ ị chọrọ ịga legharịa anya na ya. Biko, agakwala ilegharị anya na Betel ma ọ bụrụ na i bu ọrịa koronavaịrọs, nwee azụzụ, oyi ọmụma ma ọ bụ ya abụrụ na gị na onye bu ọrịa koronavaịrọs nọrọ ná nso nso a.

Hungary

BUDAPEST

Kövirózsa u. 1.

H-1163

HUNGARY

+361 401-1100

Oge E Ji Akpọgharị Ndị Ọbịa

Mọnde ruo Fraịdee

10:00 ụtụtụ 11:00 ụtụtụ na 3:00 ehihie

Ọ na-ewe otu awa na nkeji iri na ise

Ihe A Na-eme

A na-ahazi ọrụ ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị 283 na-arụ na Hungary, na-ahazikwa otú ihe si aga n’ọgbakọ anyị na-eji asụsụ Hungarian amụ ihe na Slovakia nakwa na Ukraine. A na-asụgharị akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Baịbụl n’asụsụ Hungarian nakwa n’asụsụ Lovári. A na-emepụta ihe ndị a na-egere egere n’asụsụ Hungarian, na-emepụtakwa vidio n’Asụsụ Ndị Ogbi nke Hungary.

Danloduo akwụkwọ ga-akọkwuru gị ihe ndị ọzọ.